Child bride: Ihe ise mere ndị Igbo ka ji alụpụ nwaada n'oge

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe akụkọ nwata nwaanyị dị afọ iri na isii ekenyere di ruola afọ iri ise na ụma jiri wuo na soshal midia, ọ kpalitere ụka banyere ikenye ụmụada etobeghị eto di.
Tupu nke a mere n'Anambara ewuo, ọtụtụ ndị Igbo na-arụkarị ndị Ugwu-Awụsa aka dịka ndị e jiri ịlụ nwata mara.
Mana ikuku ekuola, ahụ ike ọkụkọ dịka akụkọ nwata ọzọ a kpọrọ Ebube ,dị afọ iri na-anọ alụnyere nwoke dị iri isii na ise n'otu Anambra steeti.
Dịka otu mbaụwa nke a kpọrọ United Nations na bekee siri kwuo, ụmụada ụmụ Naịjirịa alụpụrụ na-erughi afọ iri na asatọ dị nde iri abụọ na atọ (23million).

Ebe foto si, Getty Images
Okwu akpụzi n'ọnụ ugbua bụ gịnị na-ebute ụdị agwa?
Ụfọdụ sịrị na ọ bụ ụbịam, ụfọdụ sị na ọ bụ enweghị nghọta, ebe ụfọdụ kwuru na ọ bụ ịmụ nwa na mkpụke butere ya.
Harrison Emefiele, onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụaka ma bụrụkwa onye otu ya bụ 'Behind Bars' tinyere aka ịgbapụta Chinwe kwuru na ọ bụ agụghị akwụkwọ nakwa etu e si ahụta ndị mụrụ nwa n'alụghị di.
"Chinwe nwere nwa dị ọnwa isii, ebe Ebube nwere nwa dị ọnwa itoolu."
"Chinwe amụọla nwa oge ndị be Igwilo bịara lụọ ya, ebe Ebube dị ime ka a kwụrụ ụgwọ isi ya kpọrọ ya ga n'alụsị ebe e duru iyi na ọ gaghị ahapụ nwoke lụrụ ya."
Emefiele tụrụ arịrị na ụbịam nakwa enweghị nghọta so ebute nsogbu a.
Dịka o siri kọwa, a kpụrụ Chinwe gaa n'alụsi iji duo ya iyi na ọ gaghị ahapụ di ya.
Ọ tabiri anya etu mịnịstri ọ dị n'aka si na-akpụ ụkwụ n'ala n'ụdị okwu ahụ.
Komishọna okwu ụmụnwaanyị dị n'aka n'Anambara bụ Ndịdị Mezue ekweghị asa BBC Igbo okwu oge anyị kpọọ ya n'ekwenti.
O sịrị: "ọ bụghị ka anyị sị arụ.. Ị chọọ ka anyị kọrọ gị ihe anyị ma maka akụkọ ahụ, ị bịa n'ụlọrụ anyị."
Mana ndị ji anya okenye ji ahụ ụzọ ele ihe na-arụ aka n'omenala.

N'oge gboo n'ala Igbo, a na-alụpụ nwaanyị ọsọ ọsọ.
Akụkọ kwuru na nne Chinwe lụrụ dị oge ọ dị afọ 13, nke mere n'ọ hụghị ihe ọjọ dị na nwa ya agaghị alụ di na nwata.
Dịka otu onye omenalala doro anya bụ Nze Duruagwu siri kọwara BBC Igbo, ọ na-abụkarị bido n'afọ iri na anọ rue n'afọ iri na-asatọ.
Dịka Duru agwụ onye bụkwa Olueze Ukaejuoha, siri kwuo, ihe ndị kpatara nke a bụ na n'oge gboo:

Ebe foto si, Dukere
1. Nwaanyị anaghị enwe aka ọrụ
2. Nwaanyị anaghị enwe abọ ahịa n'ụlọ nne ya
Nke a pụtara na gboo nwaanyị anaghị anọ be nna ya na-akpata akụ na-edowe dịka ọ dị ugbua.

Ebe foto si, Getty Images
3. Ihe ana- akwado nwaanyị bụ naanị ka ọ ga-esi bie be di ya.












