Referendum: Ndị agha Naijiria na-agba egbe ọnụ- Ipob

Otu Indigenouus People of Biafra nke a kpọrọ Ipob n'ịchafụ ekwuola na ndịagha Naijiria ịmaja ndị otu ha bụ ụzọ ha si achọ ịwakpo ma gbuo Ndigbo ọzọ na ntuliaka.
Ụbọchị Monde, onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Buratai nyere iwu ka echechie ndị Ipob dịka a na-akwado ntuliaka site ihiwe atụmatụ a kpọrọ "Operation Safe Conduct" na Bekee.
Mana otu Ipob kwuru na ọ bụ egbeọnụ ka ha na-agba n'ihi na ha bụ Ipob anaghị akwado ọgụ egbe na mma.
Na mkparịtaụka BBC Igbo na ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Chukwudi Peace nwere n'ekwentị, o kwuru na naanị ma ndịagha Naijiria agara n'ụlọ n'ụlọ ga na-anwụchi ndị mmadụ, na o nweghị ihe ha nwere ike imenwu ha.
N'okwu ya, ọ sịrị "Ha na-adị njikere ịlụso Ipob ọgụ, Ipob eji egbe ka ọ bụ mma?"
Ọ bụrụ na Ipob na-ekwu na anyị ga-ebu egbe pụta chere ndị na-atụ vootu, ịghọta ya n'ụdị a ha na-akọ."
"Naanị ma ha aga n'ụlọ n'ụlọ na-akpụpụta ndị mmadụ na-agbagbu. Ọ bụ egbeọnụ ka ha na-agba."
Ọ kọwara na referandum ha na-akwado ụbọchị Februwarị 16 bụ Ndigbo ịnọrọ n'ụlọ ghara ịpụta mee ntuliaka.
"Ipob kọwara ndị be anyị na o nweghị uru ọ bara ị puta kwụrụ n'anwụ maka ntuliaka."
"UN kwuru na ịchọ inwere onwe gị ị gaghị na-esonye na ntuliaka obodo ị chọrọ isi na ya pụọ maọbụ na ị pụrụ n'ilo tụnye akwụkwọ sị lee ihe ị chọrọ."
Ọ kọwara na referedum bụ ihe ị ga-eme iji gọsị ihe ọtụtụ mmadụ chọrọ nke e nwere ike igosi site n'ịnọ n'ụlọ.
"Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị mmadụ anọrọ n'ụlọ, ihe o gosiri bụ na referandum anyị agala ọfụma."
Peace boro ndịagha na ha na-atụ atụmatụ ịgbagbu ndị mmadụ kwụ n'ahịrị maka ntuliaka, bo ya ndị Ipob.










