#BBCGovDebate: Ihe dị mkpa pụtara n'Ebonyi steeti

Ogbonnaya Okorie na David Umahi bụ ndị abụọ gụnyere ndị na-azọ ọkwa ọchịchị n'Ebonyi steeti.
Dịka ha dọrịtara ụka n'ọnọdụ BBC Igbo hibere ha zara ajụjụ gbasara ụfọdụ ihe dị mkpa gbasara ndị Ebonyi ha na-achọ ịchị.
Lee ihe ndị kachasị dị mkpa sị na ndọrịta ụka ha pụta.
1. Ndị bịara ya bụ nrụrịtaụka

N'ime mmadụ anọ bụ ndị Ebonyi steeti họpụtara ha ga-ajụ ajụjụ na nrụrịtaụka a, sọsọ abụọ n'ime ha bịara.
Ndị bịara bụ David Umahi nke PDP na Ogbonnaya Okorie nke AAP.
2. Ihe gbasara esemokwu ndi Izzi na Ukelle
Gọvanọ Umahi kwuru na esemokwu dị n'etiti ndị Izzi na Ukelle nke ndị Krọs Riva bụ ihe o mere ka onyeisiala na osote ya mata.

O kwuru na ugbua ya na ogbo ya nke Krọs Riva na-etinyekọta isi ọnụ iji mara etu ha ga-esi belata ya bụ ihe.
Mazị Okorie kwuru na ọ bụrụ ya, ya na ndị eze obodo abụọ a ga-enwe mkparịtaụka ma kwụsị esemokwu a.
3. Ụmụakwụkwọ agbahapụrụ na mba ofesi

Ajụjụ gbasara ụmụakwụkwọ eboro Umahi ebubo na ọ gbahapụrụ na mba ofesi, o kwuru na onweghi onye ha hapụrụ na ọbụ ndị amahị ihe ha na akọ.
4. IPOB na Nnamdi Kanu
Umahi gọrọ agụgọ na ya anaghị arụ ọrụ megide ndị IPOB ma kwuo na omume ndị IPOB na-akparị ndị ọnụ na eru n'okwu adịghị mma.
Ọ gwakwara IPOB ka ha gbanwee omume ha ji akpari onye ọbụla.
5. Esemokwu ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo

Obi adịghị ụfọdụ ndị mmadụ mma n'ihi ihe esemokwu dị n'etiti ndị ọchịehi nakwa ndị ọrụ ugbo naara ha.
Mgbe a jụrụ Umahi ajụjụ a, o kwuru na ọ ga-eme ka onye ọbụla erughi afọ iri n'asatọ agaghị achụ ehi.
O kwukwara na ọ ga-anwụchi nne na nna nwata ọbụla ruru ịga akwụkwọ na-achị ehi.
Maazị Okorie kwuru na ọ ga-agbalị ka ya na ndịisi ndị ọchịehi kpaa ya bụ esemokwu ọfụma.
Akụkọ ga-amasị gị:














