Umahi gbatara anyị ọsọ enyemaka - Ụmụakwụkwọ Ebonyi steeti tọrọ na mba ofesi

Ebe foto si, Celestine Nwojiji
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị gọọmentị Ebonyi steeti zigara obodo oyibo maka ịgụ akwụkwọ etipụla mkpu enyemaka .
Celestine Nwojiji na ndị ọzọ ekwuola na ọ dịzi ka gọọmentị ha agbalahụla ha n'ala onye ọzọ.
Ụmụ akwụkwọ ahụ ruru mmadụ iri abụọ n'ise na-agụ ihe dị icheiche dịka nzere 'PhD, Masters' na ndị ọzọ.
"Ụfọdụ n'ime anyị na-atazị ahụhụ na-arụ ọrụ ọbụla iji hụ nri anyị riri" bụ ihe o kwuru.
Onye enyemaka Gọvanọ Umahi n'ihe gbasara agụmakwụkwọ mahadum bụ Adaeze Nwuzor zara BBC Igbo ajụjụ n'ekwentị.
N'okwu ya "dịka anyị na-ekwu ugbua, okwu ụmụakwụkwọ a dị n'ihu gọvanọ anyị bụ Umahi"

Ebe foto si, Getty Images
O kwukwara ka ndị ụmụ akwụkwọ ahụ nwee ndidi n'ihi na agụmakwụkwọ bụ ihe dị Umahi mkpa maka na ọ gụrụ akwụkwọ n'onwe ya.
Atụmatụ ịkpọpụ ụmụ akwụkwọ ndị si Ebonyi steeti mba ofesi bidoro n'aka Sam Egwu bụbu aka chịburu Ebonyi steeti.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị































