Ebonyi state Gov.: Ọtụtụ ụmụakwụkwọ PhD gọọmentị na-azụ n'ofesi agụchala

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT
Gọọmenti Ebonyi steeti ekwuola na ha chọpụtara n'ọtụtụ ndị ha na-azụ n'akwụkwọ na mahadum ala Bekee agụchaala akwụkwọ ma ka na-anakwa ego.
Nke a bụ ọnụokwu Emma Uzo bu odeakwụkwọ ntaakụkọ Dave Umahi.
Uzo sị na "gọọmenti Dave Umahi kwụchaara ha ụgwọakwụkwọ mgbe onyere ha nde narị naria anọ (N400 M) iji kwụchapụ ụgwọ akwụkwọ ha niile n'afọ 2017".
N'olu ya, "gọọvanọ mbụ malitere agụm akwụkwọ n'efu bụ Sam Egwu."
Mgbe Sam rituru, Martin Elechi weghara ya mana ọ kwụchaghị ya bụ ụgwọ akwụkwọ tupu oge ya agwu.
"Nke a mere Dave Umahi ji weghara ya kwuchapụ ya bụ ụgwọakwụkwọ mgbe ọ mere ya."
Ọ sịkwa na ha kelekwara gọọmenti mgbe ha kwụrụ ụgwọ a.
Emma Uzo sị na ya bụ "ego gọọmenti nyere ha zuru ịgụchara ha akwụkwọ."
Akwụkwọ akụkọ Vanguard bụrụ na ndị nnọchite anya ụmụ Ebonyi ahụ gọọmenti na-akwuru ụgwọ akwụkwọ na mahadum ala Bekee beere gọọmentị akwa enyemaka maka ha tọrọatọ nke bụ na ha enweghịzi
ike iri nri ọnụ n'ụlọ akwụkwọ ha dị iche iche.
Ndị nọchite anya ndị a na-agụ akwụkwọ kachasi elu bụ PhD na mahadum dị iche iche n'ala Bekee gụnyere Celestine Nwojin (Univeristy Liverpool), Nworie Obinna Elijjah (University Salford), na Ejike Dick (University Nottigham).
Otu onye bụ ndị so rite ọzụzụ efu a BBC nwetere jụrụ ịgwa anyị okwu maka ya.











