Nrụrịtaụka BBC nke Abia steeti

Ndị na-azọ ọchịchi gọvanọ n'Abia na-eme nrụrịtaụka n'Umuahia taa.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chiagozie Nwonwu

  1. KA ỌDỊ MGBE ANYỊ ZỤTERE UNU ỌZỌ!

    BBC IGBO
  2. Ka anyị jiri ụfọdụ okpụrụkpụ okwu si unu gaa nke ọma

    BBC Igbo
    BBC
    BBC Igbo
    BBC Igbo
    BBC IGBO DEBATE
  3. Ọbịala na njedebe!

    Anyị ga-ezute unu na Ebonyi n'ụbọchị nke mbụ nke ọnwa Febụwari 2019.

    Gakwanu na bbcigbo.com ga soro anyị zụọ ahịa.

  4. Maka nnapụ ọchịchị Otti na-ebo pati nọ n'ọchịchị

    “Enweghi ike ịnapu anyi ọchịchị ọzọ, makana anyi ga-etinye usoro ga-eme na ụdịrị ihe mere na 2015 emeghị ọzọ.” – Alex Otti

    yle='m�[��\K

    BBC IGBO
  5. Etu a ga-eji mee ka mmadụ belata n'Aba

    “AnyI aga-ehibe obodo ọhụru ato iji mee ka mmadụ belata n’Aba.” – Joseph Nkoro

    “Anyị ga-achọpụta ihe obodo dị iche iche nwere ike na emepụta, nke anyị eje mepe ebe nrụpụta ebe ọbụla.” – Chukwuemeka Uwakolam

  6. Ajụjụ maka IPOB

    “Ahazie Naịjirịa, ndị niile wete oke nke ruru ha, nsogbu IPOB agaghi adị.” – Blessing Okwuchi Nwagba

    “Onweghi ihe agaghi ejinwu mkparịtauka hazie. Anyi na IPOB zute, anyi ga-emezi ihe niile.” – Joseph Nkoro

    “Ya bụrụ na ụmụaka nwere ihe ha na-arụ, ụdịrị ihe agaghị eme. Ekwesighi ịhapụ ha.” – Alex Otti

    “IPOB abụghị ndị oyị egwu. Onwere ihe kpatara ihe na-ebe.” - Chukwuemeka Uwakolam

    “Enweghi ọgbọ egwueregwu n’Umuahia. Pati anyị bata, o so n’ihe anyi ga-etinye anya. Maka ihu na ndị ntoroọbịa hụrụ ebe ha ga na-amụ ‘sport’.” - Chukwuemeka Uwakolam

  7. “Ndị anyi ji ọchịchị nye oge gara aga ji ụgha na-aga. Ndị nọ ofesi ma ihe na-eme ebe a. Ihe ka mkpa bụ ịnọ n’ụlọ rụọ ọrụ, ndị ‘investor’ ga-abịa.” - Alex Otti

  8. Maka ndị nwere nkwarụ

    “Anyị ga-ahụ na iwu emere maka ndị nwere nkwara bu ihe na-arụ ọrụ” - Blessing Okwuchi Nwagba

    “Ihe bụ ihe dị mkpa. Enwere ọhị nwere nkwarụ, mụ na ya na-arụ ọru ịhụ na amatara ihe a ga-emere ndị a.” - Joseph Nkoro

    “Anyị ga-ahọpụta ndị niile nwere nkwarụ, kụsịere ha ọrụ, hu na ha nwere ihe ha na-eme.” -Chukwuemeka Uwakolam

    “Ọ dị oke mka. A ga m ahu na iwu dịrị ndị nwere nkwarụ bụ ihe obodo na-eruwere isi.” – Alex Otti

    BBC IGBO
  9. “Ego eji e me arabanko n’Abuja karịrị ụgwọ ọnwa eji ndị mmadụ

    Ya mere na akwụghị ya bụ ụgwọ bụ ihe akpachaa anya mee” - Alex Otti

  10. Ajụjụ ụgwụ opekatampe

    “36,000 ka 18,000 mma.” – Alex Otti

    “Nke m bụ 50,000. Nke ma ga-akwụ ụbọchị 26 nke ọnwa abụla.” - Blessing Okwuchi Nwagba

    “Anyị ga-ebu ụzọ lee etu akpa anyi ha. Mana ọ bu ihe ndị gọọmentị kwuru ka anyị ga-akwụ.” Joseph Nkoro

    “Aga m akwụ nke Labour si na ha chọrọ bụ 30,000, ma nye ha ihe Bekee kpọrọ incentive.” - Emeka Uwakolam

    BBC IGBO DEBATE
  11. “Anyi ga-eme ka ọkwụ banye Aba” – SDP

    “Anyi ga-eji dọtị mepụta ọkụ anyị ga-enye ndị Aba n’Abịa” - YPP

    “Ịwepụ Aba, Abịa adịezị.’ APGA

    “Aba bụ etiti mmepe Abịa. Ụzọ bụ mbụ anyị a ebụ ụzọ malite.” Accord

    BBC DEBATE
  12. "A bụ m onye ndu, abụghịm onye ọchịchị." - Alex Otti

  13. Akwadoro m akwado ịchi Abịa. Eziokwu kọrọakọ n’Abịa. Gọọmentị mere ka agụ na-agwụgbu ndị Abịa" - Emeka Uwakolam - Accord pati