Ugboro abụọ Buhari tabiri ọnụ n'achumta vootu a

Buhari

Ebe foto si, www.facebook.com/Femi-Adesina

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ntabi ọnụ bụ ihe mmadu niile n'ụwa dum na-eme kwamgbe kwamgbe, mana ya ihe anyị na-eme echefụ na mbụ bụzị ihe sochal midia nke ụwa ọhụrụ jizi eme akaja.

Ugbua bụ mgbe ndọrọndọrọ ọchịchi, otu onye na-azọ ọkwa ntabi ọnụ a na-emekarị bu onyeisiala Muhamadu Buhari.

Inye onye etozughi okọlọtọ pati ha ga-eji zọọ ọkwa gọvanọ so na ntabi ọnụ Buhari na-eme.

Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ike agwụla Buhari, nke mere okwesiri ịga zuo ike.

Otu n'ime ndị ọru ya bu Festus Keyamo tinyere ọnụ na ya bụ okwu na mkparịtaụka ya na BBC nwere.

Keyamo si na o bu ndị sị na Buhari nwere nsogbu nwere nsogbu.

Lee ihe okwuru ebe a:

Aha onyonyo, Okwu Festus Keyamo maka Buhari

Okwu Keyamo a akwụsịghi ndị mmadụ ikwu maka ntabị ọnu ndị a Onyeisiala na-eme. Lee ụfọdụ ihe ha na-arụtụ aka:

1) Nke mere mgbe ọ gara Akwa Ibom.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

2) Mgbe ọ kpọrọ onye na-azọ oche gọvanọ na Delta steeti onye na-azo oche onyeisiala.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ka osinadị ntabi ọnụ bụ ihe na-eme ụtụtụ ndị ndọrọndọrọ, ọkachasị ndi na-apụta n'ihe onyonyo.