#BBCGovDebate: Nrụrịtaụka BBC n'Abịa na-aga n'ihu ka Ikpeazu gbajọrọ ya

Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Okezie Ikpeazu bụ gọvanọ achị na-achi Abịa steeti ekwuola na ya agaghị abịa nrụrịta ụka BBC n'Abia.

N'ozi kọmịsọna mgbasa ozi nke Abịa steeti bụ John Okiyi sitere BBC, Ikpeazu kọwara na ha agaghị abịanụ nrụrịta ụka ahu dịka o si kwee nkwa makana ya na Onyisiala Muhammadu Buhari ga-ezute taa.

Okwukwara na ya ha ga-akagbụ emume achumta vootu ha chọbụrụ ime taa n'Abia maka nke a.

Onyeisi BBC Igbo bu Adline Okere kwuru na gọvanọ Abịa steeti gwara ya ka ahaziaghịa oge a ga-eji mee nrụrịta uka ahu iji nye ya ohere ịbịa.

Oge ha hotara bụ elekere 11 nke ụtụtụ, mana BBC ekweghị.

Nrụrịta ụka ahu ga-aga n'ihu dịka esi kwado.

Emume a pụtara ka nrụrịtaụka nke abụọ nke BBC Igbo nakwa nke asaa ngalaba BBC na-eme na Naịjirịa ga-eme na Abia steeti taa.

Ọ ga-amalite n'elekere abụọ n'ehihie taa bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Jenụwarị 2019.

Ndị kwere nkwa na ha ga-abịa taa bụ Alex Otti nke APGA, Blessing Nwagba nke SDP, Emeka Uwakolam nke Accord na Joseph Nkoro nke YPP.

Uche Ọgah nke APC sepụrụ aka na ya bụ nrụrịtaụka ka o kwenyebụrụ na mbụ.

Ozi a nke BBC Pidgin ziputere n'akara Twitter ha gosiri nrụrịtaụka niile ga-eme n'ala Naịjirịa.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Uche Nwosu nke AA bụ sọsọ otu onye n'ime mmadụ anọ nke a kpọrọ oku maka nke Imo steeti bụ onye bịara.

Nke a wutere ndị mmadụ nke ukwu dịka ha gwara BBC Igbo uche ha n'ihe onyonyo a.

Aha onyonyo, ihe ndi mmadu kwuru maka nrụrịta ụka BBC

Ebe ọzọ BBC Igbo ga-ahazi ntụliaka bụ na steeti Ebonyi na steeti mbụ nke ọnwa Febụwarị.