Atiku Endorsement: Anyị enyela Nnia Nwodo 'suspension' - Uche Okwukwu

Nnia Nwodo

Ebe foto si, Ohaneze/Facebook

Nkọwa foto, Nnia Nwodo chọrọ nhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara nke a kpọrọ 'Restructuring na bekee

Okwu abaala na akụkọ asi na-asị n'etiti otu jikọta Igbo niile bụ Ohaneze Ndigbo.

Nsogbu a sitere na nkwado Ohaneze nyere onye na-azọ ọchịchị n'okpuru pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) bụ Atiku Abubakar.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, aka na-achị Ohaneze bụ Nnia Nwodo kọwara etu nkwado Maazi Abubakar siri pụta ma kwuo ihe oji di mkpa.

Lee ihe okwuru:

Mana, n'ụbọchị Tụsde, BBC nụrụ na achụọla ode akwụkwọ Ohaneze bụ Uche Okwukwu n'ọrụ. Ozi a sị n'ọnụ Uche Ogbaga bụ onye ode akwụkwọ mgbasa ozi Ohaneze.

Okwukwu n'onweya jụrụ atụmatu ọchụchụ ya a, na-ekwu na ọ bu Nwodo ka achụru makana ọ dara iwu Ohaneze mgbe onyere Abubakar nkwado ahụ.

Lee ihe okwuru ebe a:

Aha onyonyo, Okwu Uche Okwukwu