2019 Elections: Atiku abụghị onye Naijiria - Nnamdi Kanu

Kanu

Ụfọdụ mmadụ akatọọla ebubo onye ndu otu IPOB bụ mazị Nnamdị Kanụ boro megide Atiku Abubakar ji aha otu pati PDP azọ ọkwa onyeisiala na Naijiria.

Kanu nọọrọ ụbọchị Satọde, na mgbasa ozi omere site na mba Briten kwuo na Atiku bụ onye obodo dibu na mba Cameroon.

O bukwara ebubo na Atiku wetara ọdịda na ntụliaka onye bubuuru osote onyeisiala Naijiria bụ Alex Ekwueme nwụrụla anwụ n'obodo Jọs n'afọ 1999.

Ọ gwaziri ndị otu ya ka ha hapụ ịtụ vootu na ntụliaka na-abịa, rue mgbe ndị nọ n'ọchịchị bịanyere aka na-akwụkwọ nkwenkọrịta e nyere ha.

N'ajụjụ ọnụ BBC Igbo gbara ya site n'ekwe ntị, onye ọnụna-eru n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị bụ Ifeanyị Ọlụmba, kọwara ebubo a dịka okpotokpo asị, ma kwuo na nke a bụ iji kpasuo ndị mmadụ iwe.

Atiku Abubakar

Ebe foto si, Reuters

O kwuru, ''ndị mmadụ kwesiri ị jụ okwu a n'ihi na nke a ga-ebutara ha mkpasu iwe''.

Na nke ya, mazị Paddy Anyatọnwụ, kọwara nke a dịka okwu e jirila mara Nnamdị Kanụ.

O mekwara ka a mata na mgbe mbụ, Kanụ bokwara ụdị ebubo a megide onyeisiala Buharị mgbe o kwuru na onyeisiala Naijiria si mba Sudan.

Ọ rụtụrụ aka, ''Nnamdị amaghị ihe ọ na-ekwu n'hi na o kwukwaala ụdị okwu a gbasara Buhari''.

Ha dụziri ndigbo ọdụ ka ha sonye na ntụliaka n'abịa i ji hazie ọnọdụ ha na Naijiria.

Akụkọ ga-amasị gị: