2018 Highlights: Ihe iribama metụtara ndị Igbo n'afọ a

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ka afọ 2018 ji nwayọ bịara n'isi njedebe, BBC Igbo na-echetara ụnụ akụkọ ndị mere ka obodo kpoo ọkụ n'afọ ahụ.

Nke gbara ụwa niile gharị bụ akụkọ mpụtagharị Nnamdi Kanu n'obodo Jerusalem kemgbe ọnwa Septemba nke afọ 2017.

Kanu

Nke mekwara nso nso a ma bụrụ nke ka na-ewu, bụ akụkọ Jubril nke Nnamdi Kanu kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari abụghị onye nọ n'Aso rock.

BBC Igbo buru ya dịka akụkọ ụgha nke a kpọrọ "Fake news"

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-agbasa akụkọ Jubril sị na ọ bụ ntị ya ka ha na-ele, mana nti Buharị nke aka nri na nke aka ekpe ya adịghị otu

Nke mekwara nso nso a ma bụrụ nke ka na-ewu, bụ akụkọ Jubril nke Nnamdi Kanu kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari abụghị onye nọ n'Aso rock.

BBC Igbo buru ya dịka akụkọ ụgha nke a kpọrọ "Fake news"

Onyeisiala pụtara kwuo na ọ bụghị Jubril.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Okwu Fada Mbaka gwara Peter Obi mgbe ọ gara ịka ụka "Bazaar" kpokwara obodo ọkụ.

Fada Mbaka na Peter Obi

Ebe foto si, AMEN/Getty

Nkọwa foto, Mbaka kwuru na ọ bụrụ na Atiku na Peter Obi atụnyereghị ụlọụka ya , ha nwere ike ị da na ntuliaka na-abịa

Mmepe ụlọọrụ BBC nke mere n'ọnwa Febrwar wuru ewu nke ukwu.

Igwe mmadụ
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị ọzọ bịakwara emume ahụ

Ka anyị mepechara, anyị wetaara unu akụkọ ihe nwunye Nnamdi Kanu gwara anyị gbasara ebe di ya nọ.

Okwu o kwuru kpalitere ọtụtụ asịsa n'ebe ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa nakwa gọọmenti etiti nọ.

Aha onyonyo, Nwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ

Akụkọ ọzọ dara ụda bụ akụkọ nwaanyị Igbo akpọrọ Mama Boko Haram.

Aisha Wakil gwara BBC Igbo etu o si zụọ ụmụaka bụ ndị otu Boko Haram taa.

Aha onyonyo, Mkparitaụka Aisha Wakil na BBC Igbo

Akụkọ Ụkọchụkwụ ama ama na Naịjịria mụrụ ụmụ ejima atọ ka afọ iri na itoolu gafechara, nyere ụmụ Igbo nakwa Naịjirịa niile oke obi ụtọ.

Aha onyonyo, Di na nwunye mụrụ ejima atọ

Okwu Abaribe kwuru maka ndị ọchịehi wuru ewu n'afọ 2018.

Aha onyonyo, Okwu Abaribe kwuru banyere ndị ọchị ehi.

Asọmpi iko mbaụwa niile narakwara ụmụ Igbo uche.

Aha onyonyo, Russia 2018: Ọgụ 'rimotu' ebidola n'ezinaụlọ ndị a

Ọzọ so ya bụ akụkọ nwuchi ụmụnwaanyị Ipob otu nar na iri anọ n'Owere.

Ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọịkpe taa.

Ebe foto si, Sam Amadi

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọịkpe taa.

Mmiri ide kpara mkpamkpa n'ala Igbo n'afọ 2018.

Aha onyonyo, Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha.

Akụkọ ha kpalitere nkata a na-akpa maka IVF.

Ụmụnwaanyị ise si n'ụlọakwụkwọ Regina Pacis dị n'Onịcha kpakwara ndị Igbo mgbe ha turu ugo n'asmpi Technovation 2018 site n'ịbụ ọkaibe n'ụwa niile.

Aha onyonyo, Mmeri anyị ga-ebuli mmụta Teknụzụ - Ụmụakwụkwọ Regina Paecis

Akụkọ ndị ga-amasị gị: