World Cup 2018: Ezi ebuola amụma na Super Eagles ga-eru ọkara ikpeazụ

Ebe foto si, Getty Images
Otu ezi akpọrọ Mystic Marcus ebuola amụma na Naịjirịa ga-eru agba ọkara ikpeazụ n'asọmpi Iko Mbaụwa ga-amalite taa na Rọshịa taa.
Ezi a kpọkwara mba Ajentina, Beljọm na Uregua ga-eso Naịjirịa ruo ọkara ikpeazụ.
Anụezi Mystic Marcus nke onye nwe ya bụ Juliette Stevens nwere akụkọ ibu amụma nkeọma.
Anụezi a buru amụma na Donald Trump ga-achị mba Amerịka nakwa ọpụpụ Brexit ị di ire.
O buru amụma a site n'ịkpụrụ mkpụrụ osisi ejiri ọkọlọtọ Naịjirịa, Ajentina, Beljọm na Uregua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:







