Ndị Egypt ekwuola na Salah ga-eso gbaa iko mba ụwa

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Egypt na-akọwa na Mohamed Salah ga-eso sọọ mpi na-mbido iko mba ụwa na Rọshịa.
Cheta na ọ dị ka Salah agaghị eso gaa Rọshịa ka o merụrụ ahụ na nku aka n'asọmpi ngwụcha Champions League Liverpool na Real Madrid gbara n'izuụka gara aga.
Salah dị afọ ise ji anya mmiri pụo n'asọmpị ahụ.
Onyeisi ngalaba n'ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Egypt bụ Hani Abu Reda, onye nchịkọta ndị otu egwuregwu Egypt bụ Hector Cuper na Mohamed Abou El-Ela na Salah zutere ụnyaahụ na Valencia, ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ngalaba a dere na Facebook kwuru: "Ndị si ngalaba na-ahụ maka otu egwuregwu Egypt nwetara ozi maka etu onye egwu a ji na-agbake. Ọ na-aga ije ọfụma ma chọkwa isonye na ndị ga-aga iko mba ụwa, ma nwekwaa agbamume onye egwu pụrụ iche chọrọ ịchụkwute ndị otu ya."
N'onwe ya, El-Ela kwuru na Salah agaghị anọ ruo izuụka atọ tupu ọ gaa soro ndị otu ya.
Egypt ga-agba bọọlụ nke mbụ ha na Roshịa n'ụbọchị 15 nke ọnwa Juun bụ mgbe ha na Uruguay ga-ezụkọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:







