Super Eagles etinyela aha Carl Ikeme na ndị ga-aga Rọshịa

Carl Ikeme

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Carl Ikeme ritere ihe akpọrọ 'ọkacha agba n'egwuregwu' mgbe Naịjirịa malitere njem iko mba ụwa

Carl Ikeme bụ onye otu ndị egwuregwu Naịjirịa bụ Super Eagles na-anata ọgwụgwọ maka ọrịa ọbara ọ na-arịa (nke bekee kpọrọ Leukaemia), ka onye nchịkọta ha Gernot Rohr na-ekwu na ọ ga-eso na ndị aha ha ga-abanye n'akwụkwọ ndị ga-aga Rọshịa maka iko mba ụwa.

Itinye aha Ikeme ga-abụ maka nkwanye ugwu dịka na ọ bụ onye gbara mbọ ọfụma, nakwa onye kwesịrị ịbụ onye oche goolu nke mbụ ma ọ bụrụ na ahụ siri ya ike.

Ikeme, dị afọ 31, chọpụtara na ọ nwere ọrịa ọbara ka ndị otu egwuregwu ọ na-agbara bọọlụ bụ Wolves na-akwado ịsọmpị n'afọ gara aga.

Ikeme agbaghị bọọlụ chachaa maka ọrịa.

Wolves mechara rite mmeri nke nyere ha mbuli elu ma kpọbanye ha na Premier League.

Nke a agaghị abụ mbụ ndi Super Eagles na-enwe onye etinyere aha maka ikwanye ugwu.

N'iko mba ụwa nke 2002 Naịjirịa tinyere aha Peter Odemwingie ka onye nke 24 ha, dị ka ha mekwara Tijani Babangida n'afọ 1998.

Carl Ikeme nwereike soro ga Rọshịa, mana ọgaghị eso sọ mpị.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ