BBC Igbo Live: Ahịa tọgbọrọ chakoo iji cheta Biafra

Ka o si aga n'ihe gbasara ncheta Biafra na Naijiria na ụwa gburugburu taa bụ Mee 30, nke afọ 2018.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Chimamaka Ihenacho and Chioma Obianinwa

  1. Daalụnụ maka isonyere anyị

    Anyị na-ekele ụnụ maka isonyere anyị na mgbasaozi ncheta agha Biafra taa.

    Biko sonyere anyị n'ebe ndị a ; bbcigbo.com nakwa na Facebook(BBC News Igbo) na Instagram bụ BBC News Igbo.

  2. Ka o siri gaa na Legọs taa

    Na Legos, ncheta Biafra bụ egwu a gwara ọgwa. Dịka ahịa ụfọdụ ndị Igbo na-azụ dịka International Trade Fair fechara efecha, maka ndị ahịa abịaghị, ndị ọzọ dịka Balogun, Idumọta, Trinity, Berger, Alaba International kworo ekwo ka na ọ nweghị ihe na-eme.

    Otu onye BBC Igbo gwara okwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na o wutere ya na ndị nọ na Legos esonyechaghi na ya bụ nọrọ n'ụlọ maka na ya bụ onye Biafra n'obi ya.

    Foto a bụ ahịa Alaba na Legos zụrụ nke ọma taa

    Ahịa Alaba na Legos
    Ahịa Alaba na Legos
  3. Lee ihe Ojukwu kwuru

    Okwu Ojukwu oge o kwupụtara nnwereonwe Biafra n'afọ 1957.

    Nnwereonwe ahụ butere agha Biafra a lụrụ na Naịjirịa afọ atọ.

    Ojukwu

    Ebe foto si, Getty Images

  4. Ndị Igbo nọ na Lọndọn na-enwe ọṅụ karịa taa

    Lee ihe onyonyo ndị Igbo nọ na London na-egosi etu ha si eme mmemme ncheta nke ha.

  5. Ncheta Bịafra na Lọndọn

    Obi aṅụrị na ịgba egwu juru ndị nọ na Lọndọn ahụ dịka ha na-eme ncheta Biafra taa.

    Ha buru egwu ogene laruo London.

  6. Kedụ Nnamdi Kanu?

    Taa bụ ụbọchị Nnamdi Kanu kwesiri ịpụta bịa duo ndị otu ya n'ime mmemme a mana onweghi onye nụrụ olu ya.

    Ajụjụ ọtụtụ kpụ n'ọnụ bụ: Gọọmenti kwuru na ha ejighi ya, ezinaụlọ ya na ndị Ipob kwuru na ha amaghị ebe ọ nọ, kedụzi ebe ọ nọ?

    Onye ga-eduzi ndị ya?

    Nnamdi Kanu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ahụbeghi Nnamdi Kanu kemgbe ọnwa Sepụtemba afọ 2017 oge ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya n'Ụmụahịa
  7. Lee ahịa Arịarịa n'Abịa steeti

    Lee foto ahịa Arịrịa nke Okwamba Primuh zitere anyị.

    Ahịa a bụ ebe a ma ama na-ekwo ekwo oge niile mana maka ncheta a taa, ọ tọgbọrọ chakoo

    Ahịa Arịarịa

    Ebe foto si, Okwamba Primuh

  8. Biafra abụghị maka naanị ndị Igbo

    Euphemia Udanoh na-ekwu na ọbụghị naanị ndị Igbo bụ ihe na-eme ncheta Biafra, o kwukwara ndị kwesiri isonye na ya bụ mmemme.

  9. Nwunye Nnamdi Kanu amaghị ebe di ya nọ

    Nwunye Nnamdi Kanu gwara BBC Igbo na mbido afọ 2018 na ọ hụbeghi di ya anya kamgbe afọ 2017 ndị agha Naịjirịa wakporo be ha n'Abia steeti. Di ya bụ Nnamdi Kanụ bụ onyeisi otu n'ime otu na-akwado Biafra bụ Ipob.

    Kanu na-efu efu kamgbe ọnwa September afọ 2017 mana ndị gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ha amaghị ebe ọ nọ.

    Aha onyonyo, Nwunye Nnamdi Kanu: Amaghị m ma di m ọdị ndụ
  10. Lee etu ndị nọ na London si eme ncheta nke ha

    Ihe onyonyo a na-egosi etu ndị Igbo nọ na London si eme ncheta Biafra taa na Trafalgar Square dị na London.

  11. Etu ndị mmadụ si eme ncheta a na sosha midia

    Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu etu agha Biafra si metụta ha ma na-egosikwa etu ha si echeta ya bụ agha.

    Nkiruka Nistoran nọ n'igwe twitter gosi akụkụ ebe ọ nọ.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  12. Ụjọ mere ndị mmadụ apụtaghị na Nnewi

    Ụfọdụ ndị pụtara ahịa na Nkwo Nnewi kwuru na ọ bụ ụjọ mere ọtụtụ ndị mmadụ apụtaghị ahịa.

    Onye setere anyị ihe onyonyo a bụ Nwabueze Nwaonwu.

    Aha onyonyo, Egwu mere ụfọdụ apụtaghị ahịa n'ahịa ọgbuawa na Nkwọ Nnewi
  13. Ihe dị omimi a hụrụ n'ime bọnka Ojukwu

    BBC Igbo bara n'ime bọnka Ojukwu ebe e dewere ihe ndị e ji lụọ agha Biafra na ihe ndị ọzọ.

    Aha onyonyo, Kedụ ihe ụbọchị Mee 30 pụtara ndị Igbo?
  14. Ụlọakụ mepere taa n'Owere

    Ụlọakụ dị n'Owere

    Ebe foto si, Vivian Duruaku

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ bekee gara ọrụ n'Imo steeti
  15. Udo dị n'Imo steeti

    Andrew Enwerem bụ kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti gwara BBC Igbo na ihe niile na-aga etu o kwesịrị.

    Na onye ji maka 'onye ọbụla nọrọ n'ụlọ ya' mechie ahịa ya, mere ya onwe ya.

    Aha onyonyo, Ndị uweojii n'Imo steeti kwuru n'udo dị na steeti ahụ
  16. Ndị Umuahia esoghị mee #sitathome

    Akachi Okoro ziteere anyị foto gosiri na ndị ụlọakụ mepechara n'Umuahia.

    Ụlọakụ dị n'Umuahia

    Ebe foto si, Akachi Okoro

    Nkọwa foto, Ọrụ na-aga etu o kwesịrị n'Umuahia
  17. Ndị ọzọ na-akatọ #sitathome

    Tupu taa eruo, Ndị Arewa Consultative Forum kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ dọọ ndị Ipob aka na ntị maka na 'onyenọrọnụlọ' ha chọrọ ime adịghị mma maka ndịnotu Naịjirịa.

    Ebe ndị uweojii Anambara steeti kwusiri ike na Ipob bụ otu a machịrị amachị nke mere na ha enweghị ike ịgwa ndị mmadu pụta bịa mee ngagharịiwe. Ndị Ipob na-ekwu na ndị uweojii enweghị ike ịkwụsị ncheta ha chọrọ ime maka ndị nwụrụ n'ihi Biafra.

  18. Ọgbọ osisi dị na Port Harcourt tọgbọ chakoo, Eze Ndu ziteere anyị foto o sere na Port Harcourt taa

    Ndị na-azụ ahịa n'ọgbọ osisi dị n'Obigbo dị na Port Harcourt apụtaghị n'ọgbọ taa.

    Timba shed dị na Port Harcourt

    Ebe foto si, Eze Ndu

    Ọgbọ osisi Port Harcourt

    Ebe foto si, Eze Ndu

  19. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na Twitter, Otu nwaanyị si na Rumuokoro na Rivas steeti na-agwa ndị mmadụ na ha agahị anwụ ma ha nọrọ n'ụlọ otu ụbọchị

  20. Ndị isi ọwụwa-anyanwụ na-akatọ #sitathome

    Tupu taa eruo, Gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahị gwara ndị Ebonyi ka ha ghara iso n'oku onyenọrọbeya nke otu Ipob kpọrọ taa maka ncheta Biafra na steeti ahụ.

    Umahi kwuru sị "Onye ahịa ọbụla mechiri ọdọahịa ya ga-emechị ya ebighebi. Onye ọbụla dara iwu a ga-ata ahụhụ. A na m agwa ndị Ebonyị ka onye ọbụla gawara onwe ya mkpa ya na-enweghị nsogbu ọbụla."

    Dịka ndị ABS si kwuo, Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano kwuru na taa bụ ụbọchị 30 nke ọnwa Mee abụghị ụbọchị ezumike, ma kwuo ka ndị ọrụ oyibo niile nọ na steeti ahụ laghachi ọrụ.