Ipob na ndị uweojii amaala aka maka Mee 30

Mwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Ipob
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii Anambra steeti na ndị Ipob na-asọ mpi maka 'onye ọbụla nọrọ n'ụlọ' ndị otu Ipob chọrọ ime n'ụbọchị Mee 30.

Ka ndị uweojii na-ekwusiike na Ipob bụ otu amachịrị amachị, nke mere na onweịghị ike ịgwa ndị mmadu pụta bịa mee ngagharị iwe, ndị Ipob na-ekwu na ndị uweojii enweghị ike ịkwụsị ncheta ya chọrọ ime maka ndị nwụrụ maka ihi Biafra.

Onye na-ekwụchịtere ndi uweojii na Anambara steeti bụ Garba Umar kọwara Ipob ka otu ndị ntoroọbịa amachaghị ihe ha na-eme, ma gwa ndị mmadụ ka ha gba ha nkịtị na-aga ọru ha.

Garba Umar kwukwara na ndị uweojii n'Anambara dị njikere maka ihe ọbụla ga-eme.

"Ndị uweojii na ndị nchekwa ọzọ agaghi egbụ oge ị hụ na-emesiri onye ọbụla butere ọgbaaghara ike.

Mana, ndị Ipob, site na ozi Emma Powerful zịpụrụ, kwuru na onweghi ihe ga-egbochi ihe ha na-akwado ime na ụbọchị 30 Mee ha kwuru na ndị mmadụ ga-anọdụ n'ụlọ, ma kwuo na a ga-eme ha bụ ihe na mba 100 ndi ọzọ.

Ka nke a na-eme, ndị mmadụ na Twitter na ekwukwa na eche bu ụbọchị 29 Mee, bu ụbọchi gọọmentị Naịjirịa kewapụtara ka oge eji echeta ọchịchị onye kwuo uche ya, bụ oge ha ga echeta ndị Naịjirịa nwụrụ n'ogbugbu mmadụ na Naịjirịa. Ha na agbasa ozi na atụmatụ ha kpọrọ #NationalDayOfMourning.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

IPOB gakwara n'ihu kwuo na ihe a ha chọrọ ime gbasara nkwanye ndị egbụrụ n'agha Biafra ugwu.

Ha kagbụkwara ihe ha kpọrọ itinye ọnụ uweojii tinyere n'ihe agbasara ha.

Ha kwukwara na ndi uweojii enweghị ikike itinye ọnụ na ihe banyere ofufe mmadụ makana ọ bụ ikike onye ọbụla nwere.

"Ndị Biafra, ebe ọbụla ha nọ, kwesịrị ịkwanyere ndị nwụru n'agha Biafra ugwu. Ndị mmadu nọ naala Igbo, mba mmiri, na ebe ọzọ kwesịrị ị nọ n'ime ụlọ site elekere isii nke ehihe n'ụbọchị 29 Mee ruo elekere isii nke Wenesde May 30,"Ipob kwuru.

Ndị akpọrọ Eastern Consultative Assembly (ECA) ekwuola na ha kwadoro ihe a ndị Ipob chọrọ ime.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ