Lai Mohammed: Buhari emeela ọfụma n'ime afọ atọ

Lai Mohammed kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari, emezuola nkwa niile o kwere mgbe ọ na-abata ọkwa ọchịchị.
O kwuru na Buhari emekarịala ka a tụrụanya n'afọ atọ ọ chịrịla.
Mohammed kwuru na ebe onyeisiala gbadoro ukwu n'imezu nkwa ya bụ n'ibuso mpụ agha, imelite akụnaụba obodo nakwa iweta ezi nchekwa.
O kwuru na kamgbe afọ garalanụ Naịjirịa na-ebilite site n'ihe ọjọọ niile ọ gabigara dịka mmeruaka, ajọ ọchịchị nakwa mgbatu ego mmanụ agbidị.
Ihe ndị ọzọ Lai Mohammed kwuru maka afọ atọ onyeisiala chigoro n'ichafu
1. Ọkụ Latrik: Ọchịchị Buhari buliri mmepụta ọkụ latrik site na 2,690 mega watts ruo na 7,000.
2. Mmepụta osikapa: Naịjirịa jizi aka ya emeputa osikapa nke bụ na tupu afọ abụọ agafechaa, o nwekwara ike ị na-emepụta osikapa ruru metric 'tonnes' nde isii ka ọ wee zuo Naịjirịa niile.
3. Nri umụakwụkwọ: Ọchịchị Buhari na-enye ụmụakwụkwọ ruru nde asatọ na puku narị abụọ (8.2million) nri n'ụlọakwụkwọ karịrị puku 45 ma nyekwa ndị osi nri karịrị puku 87 ọrụ.
4. Ụgwọọnwa ogbenye: Ọ sị na ọchịchị Buhari na-akwụ ndị ogbenye karịrị puku narị abụọ na iri itoolu na asaa (297,000) ụgwọ puku naịra ise (N5000) kwa ọnwa.
5.Akụrụngwa: O kwuru na ọchịchị Buhari agbanweela akụrụngwa Naịjirịa site n'itinye ego ruru tarịị abụọ na ijeri narị asaa (2.7trillion) na ya.
6.N-power programme: Emume a enyerala mmadụ ruru nde itoolu aka.
7.Nchekwa: Ọchịchị Buhari achụọla Boko Haram mbombo ọsọ.
8.Akụnaụba: Ihe ịda ọnụ agbatuola kamgbe ọnwa 15 ka na-aga, ọkwụkwụ ụtụisi arigotela. Ọchịchị wepụtara usoro a ga-eji hazie akụnaụba Naịjirịa ruo afọ anọ (2017-2020)

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










