Akụkọ kachasị n'abalị a: Ipob sị onye apụla na 30 Mee
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ipob amalitela izisa ozi maka Mee 30

Ebe foto si, Ebere Ekeopara
Ndị IPOB amachiela ọrụ ma ọbụ ahịa ubọchị 30 Mee afọ a.
Otu ahụ na-akpọkụ oru na Igbo ka ha tukwuru n'ụlọ maka ncheta ndị egburu na agha nakwa ndị egburu kemegbe gbanụgbanụ mnwere onwe Biafra bidoro.
Ọkụ na-agba ebe ana-amịpụta mmanụ agbidi na Yenegua

Ebe foto si, Getty Images
Oke ọkụ na agba n'ebe ana-egwuputa mmanu agbidi n'ime oshimiri dị na Yenegua taa, dịka ụlọọrụ Reuters kwuru.
Ndị akaebe hụrụ ya bụ ọkụ sị na ya bụ ọdọmmanụ nke ndị Depthwize nwe ka na-agba ọkụ ruo n'ehihihi a.
Ka ọdị ụgbụa, ndị ụlọọrụ ahụ ekwubeghị ihe kpatara ya bụ ọkụ.
Akụkọ mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Na mba ofesi, mba Ireland ekwekọrịtala na nwaanyị nwere ikike itepu afọime ọchọghị.
Mba ahụ mere ntuliaka ebe mmadụ persenti iri isii na asatọ (68%) nọ kpebie na ha achọghịzị ya bụ iwu nke megidere nwaanyị itepu afọime.
Ana atụ anya n'iwu a ga-amalite ịdị ire na ngwucha afọ a.
N'egwuregwu;
Real Madrid na Liverpool ga-akwata n'abalị a

Ebe foto si, Getty Images
, Real Madrid na Liverpool ga akwarịta mpị na ekwucha ọgwụ nke Champion league taa.
Ya bụ asọmpi ga-amalite na mgbede a ma ọfọdụ nkejị iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ (7:15).
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:










