Ndị gbara ọsọndụ Kamerunu 'karịrị ụgboro atọ' na Naijirịa

Ebe foto si, AFP
Ndị ọrụ enyemaka na Cross River steeti gwara BBC na ihe dịka mmadụ puku iri atọ na puku atọ si mba Kamerunu bata Naịjirịa.
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ihe mberede na steeti ahụ bụ John Inakuththe kwuru na ọnụ ọgụgụ nke a bụ ezie.
O kwukwara na ọnọdụ ndị ahụ na-emebị kwa ụbọchị na-aga mana ha na-akwado irụrụ ha ebe obibi nke nta.
Ndị ọrụ ebe ahụ na-akwado ibido denyewe aha ndị ahụ gbatara ọsọ na Naịjirịa ka ejiri ya mara ihe a ga-emere ha.
Otu nwoke n'ime ndịa na-agba ọsọndụ gwara BBC na ọ nọrọ izuuka asatọ ebe ọ na-agagharị n'ime ohịa.






