Buhari: Ka anyị lụọ ọgụ megide mwakpo ụmụaka

Ụmụaka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Naịjirịa na-echeta ụmụaka ha niile n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala Mohammadu Buhari wepụtara ozi iji cheta ụbọchị ụmụaka na Naịjirịa bụ nke o kwuru ka-akwụsị mwakpo ụmụaka.

N'ozi ya, Buhari kpọkuru ndị ọrụ nchekwa, ezinaụlọ, ndị isi obodo, ndị isi okpukperechi, na ndị ọrụ bekee ka ha kee ajụ n'ume iji chekwa ugwu ruru ụmụaka.

Ọ gwara ndị ọrụ nchekwa ka ha gbali sie ike chekwa ụmụaka site n'ihe mmerụahụ ọbụla dịka e dere ya n'iwu Naịjirịa.

O kwuru na otu ihe kachasị mkpa nke ọchịchị kwere na nkwa bụ i nye ụmụaka agụmaakwụkwọ tara ọchịchị.

O kwuru na ọchịchị ya agbaala mbọ ịhụ na-enyere ụmụakwụkwọ nrị kwa ụbụchị dịka ha kwere na nkwa.

Ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ na-efe ọkọlọtọ Naịjirịa n'obi ụtọ

Buhari kwuru na ụmụaka bụ ọdịnihu Naịjirịa, na-atụmatụ si n'aka ha na-enye ya owuweanya na Naịjirịa nwere ndịnihu dị mma.

N'ikpeazụ Buhari gwara ndị isi ụlọakwụkwọ dị icheiche ka ha gba mbọ chekwa ụmụakwụkwọ etinyere n'aka ha.

N'otu aka ahụ,lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ncheta ụbọchị ụmụaka taa n'akara twitter:

Onyeisi senate bụ Bukola Saraki kwuru na oge mmemme ncheta ụmụaka nke arọ 2018 kwesiri ị bụ mgbe onye ọbụla ga-eme ihe niile dimma iji chekwa ụmụaka.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ebe onye bụ bụ osote onyeisiala akpọrọ Atiku Abubakar ayọla ka onye ọbụla wepụta ohere ṅụọ ụmụaka Naịjirịa ma mee kwa ka ọchị hara ipụ ha n'ihụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Akara ntụ-ntụ
Akara ntụ-ntụ