Ntuliaka imeụlọ APC: Gịnị ga-eme ugbua?

Ndị Ekiti pụtara maka ntuliaka ime ụlọ ndị APC n' ọnwa Mee 5, 2018

Ebe foto si, Abdullahi Garba Birnin Kudu

Nkọwa foto, Ọgbaghara so ntuliaka ime ụlọ ndị APC mere n'akụkụ Naijiria dị icheiche

Otu pati APC mere ntuliaka nke ime ụlọ na wọdụ ha niile dị na ala Naijiria, dịka ha mere nhọpụta onye ga-azọ ọkwa gọvanọ na steeti Ekiti na aha otu ahụ.

Ogbaghara pụtara nke tara isi mmadụ abụọ na Legos na Delta steeti,ebe emerụrụ ọtụtụ ahụ na Oyo steeti ebe e higharịrị ntuliaka ahụ.

Ọ bụ tigbu-zọgbuo and ihe ike so ntuliaka ahụ mere ka Gọvanọ Nassarawa steeeti, Tanko Al-Makura, onye bụ onye ndu kọmitii ntuliaka nke Ekiti jiri kagbuo ntuliaka ahụ.

Nsogbu dabutara na Ekiti,Kano,Imo.Rivas na steeti ndị ọzọ.

Lee steeti ndị nwere agba gbaghapụrụ ntuliaka ime ụlọ ndị APC:

1. Na Kano, Kwankwanso,Abubakar esonyeghị

Rabiu Kwankwanso

Ebe foto si, Rabiu Kwankwanso/Facebook

Nkọwa foto, Rabiu Kwankwanso bụbụ Gọvanọ kano Steeti esonyeghị na ntuliaka ime ụlọ nke APC mere na steeti ahụ

Onye chịbụrụ ọkwa Gọvano bụ Rabiu Kwakwanso na Sinetọ na-anọchite anya Kano Centralụ bụ Hafiz Abubakar emeghị ntuliaka ahụ.

Onye orụ mgbasaozi Kwakwanso bụ Binta Sipkin gwara ụlọ akụkọ Premium Times, na ndị otu APC kwụnyere Kwakwanso mere ntuliaka nke ha na wọdụ 484 dị na steeti ahụ.

Mana ọnụ na ekwuru Gọvanọ stteeti ahụ bụ Abbar Awnwar wuru na Gọvanọ steeti ahụ bụ Umar Ganduje kwuru na ntuliaka ahụ gara nke ọ ma iji gosi na a nabara pati APC na okpuru ọchịchị iri anọ na anọ dị na steeti ahụ.

2. N'Adamawa, Bindowapụtaghị

Gọvanọ na-achị Adamawa bụ Mohammed Jibrilla Bindow esonyeghi mee ntuliaka ahụ.

Ndị ji ọkwa ọchịchị na steeti ahụ apụtakwaghị na ntuliaka ahụ.

Ndị na-akwado Buhari dịka babachir Lawal kwuru na na ndị apụtaghị na-egosi akwadoghị Buhari ịlọghachi ọzọ dịka onyeeisiala.

3. N'Edo, anya ahụghị Oyegun

John Odigie-Oyegun

Ebe foto si, @APCNigeria

Nkọwa foto, A napụrụ Oyegun ohere ị ga n'ihu dịka onyeisioche pati APC iji mekwata Bola Tinubu

Onyeisioche APC n'ala Naijiria bụ John Oyegun,esonyeghị na ntuliaka nke e mere na wọdụ ya dị n'okpuru ọchịchị na Bbini Isi obodo, Edo steeti.

Akụkọ kwuru na Oyegun ji ihe dị mkpa n'aka nke mere na ọ gaghị ọgbakọ ahụ dị oke mkpa.

4. N'Ogun, Osoba esonyeghị

Gọvanọ chịbụrụ Ogun steeti bụ Olusegun Osoba agaghị ntuliaka ime ụlọ APC nke mere na steeti ahụ.

N'Anambra, Nwoye na Ngige akwatara dịka, onye zọburu ọkwa Gọvanọ na ntuliaka gara aga bụ Tony Nwoye bọrọ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Sinetọ Chris Ngige ebubo ịchọ iweghara pati APC na steeti ahụ. N'Imo, obi adịghị Rochas Okorocha ka ntuliaka ahụ sị ga nke mere ọ ọ ga kwa onyeisiala ka o tinye anya n'ihe mere n'imo.

Mana dịka a na-ekwu maka ọgbahara na nsogbu so ntuliaka, onyeisioche APC na Egwu steeti bụ Ben Nwoye gwara onye ntaakụkọ BBC na ebe ntuliaka ahụ gara nke ọma karịrị ebe ole na ole e nwere ọgbaghara nke ,dịka o siri kwuo, na-egosi na APC bụ pati nwere nkwado ọchịchị onye kwu uche ya nke na adịghị dịka ndị PDP na-etinye onye masịrị ha kama ime ntuliaka.

Cheta n'ụfọdụ ndị isi APC jụrụ ịga ọgbakọ ha mere, kpatara ụfọdụ ndị ji ajụ ma nsogbu dị n'ime pati ahụ ọ na akawanye njọ.