Mohamed Salah ọ ga-agba asọmpi iko mba ụwa?

Mohamed Salah

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mosalah nwere mmerụ ahụ nkwapụ nku
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Egwu ji ọtụtụ ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya karịsịa ndị nkwado Liverpool na mba Egypt na Mohamed Salah maka mmerụ ahụ ya.

Cheta na Salah nwere mmerụ na nku aka ya mgbe Liverpool na Real Madrid zutere n'asọmpi ikpeazụ nke Uefa Champịọns nke mere eji wepụ ya n'ike.

Onye nchịkọta otu Liverpool bụ Jurgen Klopp kwuru na mmerụ ahụ bụ nnukwu ihe na ọ dịka ọ gbajiri ọkpụkpụ olu.

Mana otu na-ahụ maka egwuregwu na mba Egypt kwuru na ọ bụ naanị nkwapụ nku aka ka Salah nwere.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'ime ihe ndị a niile, amaghị ma mmerụ ahụ ọ ga-ekwe ka Salah soro otu bọọlụ Egypt gbaa asọmpi iko mba ụwa nke dị nso nso.

Ndị nyocha ahụ kwuru na ọ ga-ewe onye nwere nkwapụ nkụ izu iri na otu rue izu iri na isii iji gbakee nkeọma.

Mmerụ ahụ Salah

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ramos kpachiri aka Salah dịka ha na-ada n'ala

Kama Mohamed Salah ekwuola site n'akara twitter na instagram ya na ọ ga-esonye ndị otu gbaa asọmpi iko mba ụwa.

Ọ kelekwara ndị nkwado ya maka ịhụnanya ha gosiri ya n'oge uhe mgbu a.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Akara ntụ-ntụ
Akara ntụ-ntụ