Akụkọ kachasị n'abalị a: Salah ọ ga-aga iko mbaụwa?
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Mo Salah tụnyere aka ya na-mmeri emeriri ha ụnyahụ

Ebe foto si, Getty Images
Ị ma na Iko mbaụwa afọ a nwere ike ịcha Mohammed Salah?
Onye nlekọta otu egwu bọọlụ Liverpool bụ Jurgen Klopp ekwuola na mmerụ ahụ Mohamed Salah nwere abụghị obere ihe, na ọ dịka ọgbajiri ọkpụkpụ olu ma ọ bụ nku aka.
Ndị uweojii adọọla aka na ntị maka ogbunigwe dị n'ala

Ebe foto si, EBERE AMARIZU
Ndị uweojii akpọkuola ndị ọrụugbo na ndị ọrụụzọ ka ha saa anya miri maka ogbunigwe e liri n'ala oge agha.
Ebere Amaraizu bụ ọnụ n'ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti kpọrọ oku a na mkparita ụka ya na BBC Igbo nwere taa.
Onyeisiala Buharị ekwela ụmụaka nkwa taa bụ ụbọchị ha

Ebe foto si, Bashir Ahmed/twitter
Dịka taa bụ ụbọchị ncheta ụmụaka n'ụwa nịịle gbaa gburugburu, onyeisiala Buharị akpọkụola ndị nkuzi, ezinaụlọ nakwa ndị ọrụ nchekwa obodo ka ha do do do hụ na ụmụaka nwere ezi nchekwa na Naịjirịa.
Onyeisiala kpọrọ okụ a n'ozi ya ebe oha na eze turu anya na ọ ga ekwute maka ụmụaka Chibok fọrọ na Leah Sharibu ka na-efu efu.
Akụkọ mba ofesi;
Amụma mmiri akwụsịla ndị ụgbọelụ na Britain

Ebe foto si, Getty Images
Oke egbe igwe gbara na Britain unyaahụ emela ka ụgbọelụ ndị kwadoro ime njem taa kwusị njem ha n'ọdọ ụgbọelụ Stansted.
Ya bụ egbeigwe tinyekwara okụ n'ebe ụfọdụ nke a sị na ndị na-achụ ọkụ gbanyuru n'isi ụtụtụ taa.
Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:












