Britain ga-arụ ụlọ mkpọrọ na Naijiria

Gọọmenti Britain akwadoola ịrụ ụlọ nkpọrọ n'Nijiria
Nkọwa foto, Gọọmenti Britain adịla njikere ịrụ ụlọ nkpọrọ na'Naijiria

Onye ode akwụkwọ ndị Britain na ihe na-eme na mbaọzọ bụ Boris Johnson kwuru na ya bụ ụlọ mkpọro ọhụrụ ga-enyere aka imejuputa mkwekorita Nijiria na Britain nwere ịdị na-agbanwe ndị nga ejidere .

Mgbanwe a ga-eme ka nwa afọ ọbụla ejidere dara iwu na-ala ọzọ ka akpọlaa ya obodo ya ka ọga nọọ afọ ole atụrụ ya n'ụlọ mkpọro.

Ụlọ mkpọrọ ahụ a na-ekwu na oga adi ọnụ ụlọ otu nari na iri na abụọ, bụ nke aga eguzobe n'ime ụlọ mkpọro kirikiri dị na Lagos steeti wee dowe ndi nga ụmụ Naijiria karịrị nari atọ nọ na Britain.

Nke a so na nkwekọrịta Naijiria na Britain nwere na 2014 na onye ọbụla atụrụ nga na Britain ga-ala na be ha gaa mkpọrọ.

Dịka ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka ikpe na Britain siri kwuo, ụmụ nijiria nọgasi n'ụlọ mkpọro di iche iche na Britain di nari ato na iri na abụọ n'ọnụ ọgụ ka mgbe 2016.

Onụ ọgụ a na-egosiputa pasenti atọ na agbakọọ ndi nile nọ n'ụlọ mkpọrọ na abughi ala nna ha n'uwa nile.

Mana ndị na-ahụ maka ikike diara mmadụ kwuru na ọnọdụ ụlọ mkpọrọ na Naijiria bụ ihe ịgba anya mmiri.

Ha kwuru na ọnọdụ ahụ jọrọ njọ nke ukwuu nke na ndị ala anyị nọ n'ụlọ mkpọrọ anaghị ekwe alọta .

Ndi emekwaranụ mmanye, na-aga gbaa akwụkwọ sị na ọnọdụ ụlọ mkpọro Naijiria na-emegide ikike diara mmadụ nke ha.

Ya mere gọọmenti Britain jiri werezia aka ya malite njem irụ ụlọ mkpọro ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: