Champions League: Liverpool eruola agba nke anọ

Mohammed Salah

Ebe foto si, Rex Features

Nkọwa foto, Mohammed Salah nyere aka n'ime goolu iri ise Liverpool nyere n'afọ a

N'asọmpị Champions League ụnyahụ Liverpool meriri Man City ọkpụ abụọ mana ha satara otu.

Liverpool ji mmerị nke a ruo ọkara-ikpeazụ n'asọmpị iko Champions League nke mbụ n'ime afọ iri.

Na mkpakọ akara ha niile, Liverpool meriri Man City ọkpụ ise mana ha satara otu.

Ndị nyere goolu

Otu Liverpool

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Afọ 2007-08 bụ ikpeazụ Liverpool ruru agba nke anọ n'asọmpị Chamions League

Gabriel Jesus bụ onye nyere goolu nke mbu n'ime nkeji abụọ nke mbụ n'asọmpị a.

Ọ bụ n'ọkara nke abụọ, na nkeji iri ise na isi n'egwuregwu ahụ ka Mohammed Salah bụbụ onye ha na-akpọ onye anwansị nyere goolu nke mbụ nke otu Liverpool.

Roberto Firmino nyere Liverpool goolu nke abụọ na nkeji iri asa n'asatọ.

Liverpool ha nwere ike iburu iko asọmpị Champions League?

Pep Guardiola

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ogbubọọlụ chụrụ Pep Guardiola n'ọgbọ egwuregwu n'asọmpị a makana ọ na-abara ha mba

Mmeri nke a enyeela Liverpool obiisiike na ha nwere ohere iburu iko a.

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara bọọlụ ekwuola na ndị na-agba n'ihu n'otu Liverpool nwere ike iyi ndị otu ndị ọzọ fọrụ na Champions league nnukwu egwu.

Ugbua, ọ dịka na Real Madrid na Bayern Munich nwere ike iso Roma na Liverpool n'ime ndị otu ọkpụ abụọ.

Akara ntụ-ntụ
Akara ntụ-ntụ