Nigerian music Concert: Etu ị ga-esi gbanahụ mwakpo na mmemme egwu

Ebe foto si, Getty Images
Etu ị ga-esi chekwaba onwe gị na mmemme egwu a kpọrọ "music concert" na Bekee.
Oge mmemme ekeresimesi bụ oge ndị mmmadụ ji apụ apụ ekworị ndụ.
Ebe ọ na-akpọtụ akpọtụ ka ụmụntorobịa na-aga oge ekeresimesi a na emume ndị ọzọ.
Otu n'ime ebe a bụ nzukọ ebe ndị n'eti egwu na-abịa agụ egwu ha nke ndị Bekee kpọrọ, "music concert".
Anyị anụla ọtụtụ akụkọ gbasara ka esi awakpo ụmụnwaanyị n'ebe dị etu a.
E nwere ike iwakpọ gị bụ nwaanyị n'ụdịrị mmemme a dị ka e si mee nwaanyị a.
Ọ gara mmemme Davido mere na nsonso a wee kwuo na a nara ya ekwentị ya ma wakpokwa ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Lee ụfọdụ azụ ndị ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa tụnyere anyị bụ ka ụmụnwaanyị na-aga ikpori ndụ ga esi were chekwaba onwe ha.
Uzoma Anyaora kwuru sị:
- Ụmụnwaanyi na-aga ụdị ebe a kwesịrị ijide ihe ndị Bekee kpọrọ "taser" ya na "pepper spray" ọ ga-abụ onye bịa inye ha nsogbu, ha ewere ihe ndị a were chekwaba onwe ha.

Ebe foto si, Getty Images
Onye ị gbara "pepper spray" ga-eburugodu ụzọ chọwa etu ọ ga-esi hụ ụzọ tupu ọ kọwa etu ọ ga-esi metụ onye ọzọ aka.

Ebe foto si, Getty Images
Nma Olebara kwuru sị:
- Ụmụnwaanyị kwesịrị ịnọkọ ọnụ, na-aga n'igwe n'ihi na ọ na-ahịa ahụ ịwakpo ọtụtụ ụmụnwaanyị nọkọrọ ọnụ.

Ebe foto si, Getty Images
- Ọ bụrụ na gị bụ nwaanyị hụ na ị nọ na nsogbu maọbụ na o nwere onwe chọrọ ịwakpo gi, tiwe mkpu, kpọba oku ka ndị mmadụ mara ihe n'eme.

Ebe foto si, Getty Images
Haruna Mohamed kwuru sị:
- Onye ọbụla ejina ihe bara uru maọbụ dị ọnụ were gawa ụdịrị ebe ahụ dịka ọlaedo na ọlaọcha maọbụ ekwentị.

Ebe foto si, Getty Images
- Gbaa mbọ hụ na ị nwere akara ekwentị ndị uweojii nọ na okirikiri ebe a na-eme mmemme ahụ ka ọ ya abụ ọ kpọtụba, ị kpọrọ ha ka ha nwee ike ịgbata ọsọ enyemaka.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị okachamara n'ihe gbasara nchekwa kwukwara na ọ dị mkpa na ụmụnwaanyị yichiri onwe ha ọfụma ma ha na-aga mmemme ahụ ma hapụkwa ịṅụ oke mmanya ka ha were mara oge ịhe ọbụla bidoro.








