National Security: Tupu ị gbara lawa Ekeresimesi, gụọ akụkọ a!

Ka oge ekeresimesi ruru, ụfọdụ ndị nwere ohere ilaru ụlọ (ọkachasị ndị si mba ofesi) na-atụ ụjọ etu ha ga-esi laa n'udo ma lọghachite na-enweghị ndị zuru ha ohi maọbụ tọrọ ha.
N'ime afọ ole na ole gara aga, e nweela ụfọdụ ọmụmatụ ndị lọtara ekeresimesi lọkwute ọnwụ ha.
Nke mere n'Imo steeti n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2017, ebe a gbagburu Chuks Okebata bụ onye agha na mba Amerịka, so tinye ụjọ n'ahụ ụfọdụ ndị bi na mba ofesi.
E nwekwaala ndị nke a tọrọla iji napụta ndị nwe ha ego mgbapụta, ma nwee ndị nke e zuru ohi, nakọrọcha ha ihe niile ha ji lọta.
Gịnị ka ị ga-eme iji chekwa onwe gị?
A bịa na nchekwa, gọọmentị Anambara steeti kwuru na ha agbaala mbọ ịhụ na agaghị anụ akụkọ na-ada aja aja na ntị banyere ndụ ndị mmadụ n'oge ekeresimesi a.
Na websaịt ndị uweojii Naịjirịa, ha depụtara usoro ị ga-eji chekwa onwe gị na ezinaụlọ gị.

Ebe foto si, Getty Images
- Ejila aka gị achịpụta onwe gị ụkwụ n'ama: Ndụmọdụ ha na-enye bụ ka mmadụ ghara ịpụta ezi na-agba onwe ya na ihe ndị o ji bata n'anwụ. Egosila ndị mmadụ "ị makwa ndị anyị bụ?" Ọ ga-eme ka ndị omekome tinye anya n'ahụ gị, nke nwere ike ibutere gị nsogbu
- Kpọchie ọnụụzọ gị ugboro abụọ: Tupu ị pụọ ezi maọbụ ị nọrọ n'ụlọ gị ọkachasị n'abalị, hụ na ị ji igodo gị gbachie ụzọ gị nke ọma, etu mmadụ agaghị esi gbakaa maọbụ kpakaa ụzọ gị
- Puo anya n'azụ isi gị: Saa anya gị mmiri, mara na ndị nọ nso ụlọ gị maọbụ ebe ị gara emume nwere ike na-akpa agwa a ga-enyo enyo. Gbaa mbọ hụ na ị meghị ihe ha ga-eji "bịara gị mgbaru" n'ụlọ gị
- Gbaa ama ntụmadị: Mee ka ndị ezinaụlọ gị mara ebe ị na-aga. Marakwa na ọ bụghị onye ọbụla n'ezinaụlọ gị ka ị ga-agwanwu okwu a. Chetakwa na ọ bụ oke nọ n'ụlọ gwara oke nọ n'ama na ngwugwu ogiri nọ n'usekwu
- Kedo ụmụ gị n'ukwu: Ụwa emebiela, mgbe mbụ e nwere ike hapụ ụmụaka ka ha pụọ ọrịrị etu masịrị ha, mana ugbua, onye chọrọ inweta gị nwere ike isi n'ụmụ gị. Ya mere, ị ga-agba mbọ hụ na ị na-eleru anya ebe ụmụ gị nọ oge niile. Elepụla ha anya makana ị maghị ihe ga-eme n'otu ntabianya
- Dọọ ezinaụlọ gị aka na ntị: Enwe sị na ọ kwọ nwa ya n'azụ mana ọ maghị mgbe ọ ghọrọla ụtụ rachaa. Ekwela ka ị dabanye na "amatara m mee". Gwa ezinaụlọ gị anatala ihe ọbụla n'aha gị ma ọ bụrụ na ị nọghị ebe ahụ ịmata ma ọ bụ ihe ị tụrụ n'ahịa ka e gotere. Dọkwaa ha aka na ntị maka ụdịrị akụkọ ha na-akọ n'ezi, ka ha ghara ịgwa ndị mmadụ "ihe ọhụrụ nne na nna ha zụtaara ha".

Akụkọ ga-amasị gị:







