Enweghi ego emela ọtụtụ ndị mmadụ ịtọ n'ụlọọgwụ

Aha onyonyo, Ndị e ji n'ụlọọgwụ

O nweghi onye na-ekpe ekpere ka ọrịa bịakute ya mana ọ bụ otu ihe nwereike ịdakwasị onye ọbụla.

Mana ọtụtụ ndị ogbenye ebela akwa arịrị gbasara etu ndị ụlọọgwụ siri kpaso ha agwa maka na ha ejighi ego ha ga-eji kwụọ ụgwọ ụlọọgwụ.

Ndị ụlọọgwụ Iyienu dị n'Ọnịcha ekweghi ka Ngozi na di ya Chinonoso Osegbo hụ ozu nwa ha nwụrụ anwụ maka na ha akwụghi ụgwọ.

N'akụkụ nke ya, Chiamaka Ogbodo nọrọ n'ụlọọgwụ ihe karịrị otu afọ ka ọ mụchara nwa maka na o nweghi ike iweta ego ụlọọgwụ nyere ya kwụọ.

Ndị a bụ ndị a kpọrọ aha n'ihe gbasara okwu a mana ọtụtụ ndị mmadụ na-agabiga ihe a na Naịjirịa niile.