Fuel scarcity: Obi gị dere duu, anyị nwere mmanụ ụgbọala ga-ezuru gị - NNPC

Igwe e ji ere mmanụ
Nkọwa foto, Igwe e ji ere mmanụ

Ọ bụrụ na ị chị obi n'aka maka etu ị ga-esi eme mmanụ ụgbọala dịka a na-atụ ụjọ ma ndị na-ere ya a ga-agba abụbụọrụ, wetuo obi gị.

Nke a bụ makana Ndu Ughammadu bụ otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ụlọọrụ NNPC, kwuru na ha nwere ebe mmanụ dọ, nke ga-ezu ndị mmadụ ihe ruru ụbọchị iri ise na abụọ.

Ughammadu kwuru na mgbachi ọdọ mmanụ ndị azụmahịa nke nọrọ onwe ha, agaghị ebute ụkọ mmanụ ụgbọala.

O kwuru na onye ndị ụlọọrụ ya nakwa ndị azụmahịa mmanụ ụgbọala ya na ha kwekọrịta ka ha nọrọ n'ọrụ kwa ụbọchị ka a aghara inwe ụkọ mmanụ ụgbọala na Naịjịrịa.

Ughammadụ kwuru na n'agbanyeghi na ụjọ na ndị otu Depot and Petroleum Products Marketers Association of Nigeria (DAPMAN) na-akwado ịgbachi ọdọ mmanụ ugbọala ha na-ere, Gọọmentị etiti na-aga n'ihu ịkwụ otu ụzọ gụnyere ijeri narị naira abụọ, iri atọ na isii n'ime ụgwo ha ji ndị azụmahịa mmanụ ụgbọala dịka FEC si kpebie.

Ọ rịọrọ ka ụmụ Naịjirịa kpesara ha ụlọọrụ ọbụla na-ere mmanụ ụgbọala ga-achọ iji ohere a megide ndị mmadụ site n'ibugo ego ọnụ mmanụ ụgbọala.

Ughammadu kwuru na ego ọnụ mmanụ ụgbọala ka bụ narị naịra iri anọ na ise.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: