Sexual Abuse: 'Anyị biacha ekpere onye ọgwụgwọ nsọ edina anyị'

Ọgwụgwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ na-agakarị 'ụlọọgwụ ọgwụgwọ nsọ

Ụmụnwaanyị karịrị iri ekwuputela etu onye ọgwụgwọ nke ime mmụọ nọ na mba Brazil si emetọ ha ahụ ma ha bịa n'ụlọ ekpere ya.

Joao Teixeira de Faria onye a ma dịka "Jao nke Chukwu" bi 'obodo Abadiania mana o nwere ọtụtụ ndị nso nso na mba ụwa niile.

Onye na-ese esereese bụ Zahira Leeneke Maus onye mba Dutch gwara ụlọ mgbasa ozi akpọrọ Globo TV na Faria họgburu ya ma kwaso ya iko.

Faria

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Faria ji aka ya ba onwe ya "Jao of God"

N'ime akwụkwọ ozi Faria degara Globo, ụlọ ọrụ ya gọrọ ebubo a eboro ya.

Ozi ahụ kwuru na Faria dị afọ iri asaa na isii na-eji ike ya agwọ mmadụ ruru puku ole maọbụ ole mana na-ajụkwa ebubo mmerụaka ọ bụla a na-ebo ya ma ọ na-agwọ ndị mmadụ.

O nwere ndị ọzọ na-ekwu udiri ihe a ?

Ụmụnwaanyị ruru itoolu na-achọghị ka akpọpụta aha ha agwala ụlọ ọrụ mgbasa ozi Globo na Faria metọrọ ahụ ha ma họgbuo ha na o na-etinye ike idi ọcha na-ahụ ha.

Ụfọdụ sị na ha na-achọ ọgwụgwọ obi ọjọ na-eme ha mgbe mmerụ ahụ a mere.

Akpọchibuola Faria onye na-abụghị dibia bekee n'ụlọ mkpọrọ ma daa ya nha makana o nweghị akwụkwọ nyere ya ikike ị mee ọgwụgwọ

Faria na ndị ama ama

Nwaanyị onyonyo ama ama na mba ụwa niile bụ Oprah Winfrey gara njem nleta na Brazil n'afọ 2013 ị hụ Faria ebe ọ na-eme ọgwụgwọ ya n'ụlọọgwụ ekpere ya.

Ụlọọrụ mgbasa ozi ABC kwuru na Faria na-ekwu na dibia ruru iri atọ nakwa ndị ọzọ nwereike ị banye ahụ ya ma weta ọgwụgwọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị :