"Guff na-akpọfe m n'ala ndị mmụọ"

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe mba Canada sonyere na ndị mba kpebiri na o nweghị mmehie dị n'ise igbo okwu ise ya amalitela ọzọ na mba ụwa.
Ọ bụ eziokwu na onweghị mmehie dị na ise igbo?
N'ime akwụkwọ ozi United Nations zipuru n'afọ gara aga, ha dere na mmadụ ruru nde 158.8 bụ ndị na-ese igbo na mba ụwa niile.
Na mba ụwa ọ bụ sọọsọ mba atọ tinyela ya n'iwu ala ha ka ndị mmadụ na-aṅụ ya ka ọ si masiri ha.

Ebe foto si, Getty Images
BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị Naịjịrịa na-ese ahịhịa echiche ha gbasara okwu a: ''o nwere njọ dị n'ise 'guff'?''
"Ọ bụ obi mgbawa nunyere m n'ise guff"
Celestine (ọ bụghị ezigbo aha ya) gwara BBC Igbo na ọnọdụ ọ hụrụ onwe ya mgbe o bidoro bụ ihe nunyere ya ise guff.
"Enweghị ọrụ bụ ihe dubara m n'ihe a.
"O nweghị ihe m na-arụ. Nke a butere ahụ mgbakasị mana oge m bidoro ise guff, ahụ akụda m"
O kwukwara na: "Ugbua enwetela m ọrụ, anagha m aṅụzi ya ka m sị aṅụ"

Ebe foto si, Getty Images
Onye ọzọ kpọrọ onwe ya 'Stone-Cold' gwara BBC Igbo na ise guff bụ ihe masiri ya makana o na-eme ya obi ọma.
N'ọnụ okwu ya, ''Anaghị m eri nri ọfụma naani ise igbo mana anaghị m atụ egwu na ọ ga-arịa m ahụ".
Onye ọzọ aha ya bụ Sylvester gwara BBC Igbo na igbo bụ ihe sị ala ndị mmọ malite n'ụwa.
O kwuru na: "Ihe a na-ahịa ahụ ịkọwa, mana ọ na-akpalite mmụọ m oge ọbụla m sere ya."
Ọ na-ata m ahụ
Mana ise igbo na-ebute kwa ụfọdụ nsogbu na-ahụ ha dịka ha siri kọwa.
Dọkịnta Anthony Mgbolu kọwara na ise igbo na- akọ ha ụra n'anya meekwa ka ndị na-aṅụ ya na-ahụ ihe na-adịghị.
Sylvester kwuru na oge ya enweghị ego, igbo na-ata ya ahụ n'ihi na igbo na-eme agụụ nri oge ọbụla.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ gara n'ihu kwuo na "Mana abụ m onye nka, ise guff na-akpọfe m n'ala ndị mmọ makana ọ na-enye m ike ika nka nke ọma'
Celestine na nke ya kwuru na oge ọbụla ya esighi guff, ọ na-eme ka iri nri hịa ahụ.
Mana o na-arịọ ka a ghara iwepụ itinye ise igbo n'iwu ala Naijiria n'ihi na ọ ga-emebi obodo.
Celestine kwuru, "Ọtụtụ ụmụntorobia anyị ga na-esi ya dịka ndụ dị na ya. Ọ bụghị ihe a ka anyị chọrọ ugbua.
"Ihe anyi chọrọ bụ ndozi ala Naịjirịa, ya kachasị mkpa"
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị









