Mmachi Codeine: Ọgwụ ụkwara adaala ọnụ

Ebe foto si, BBC
Dịka ilu Igbo kwuru na ala adịghị mma bụ uru ndị eze, mmachi gọọmenti etiti machiri ọgwụ codeine, e meela ka ọgwụ ụkwara nwere codeine dị oke ọnụ.
Mmachi a machiri ọgwụ ahụ butere ụkọ ya n'ahịa nke bụ na-anaghịzị ahụ ya anya, ebe ahụ ya ahụ ọ bụrụ na ọ dara oke ọnụ.
A na-ere ọgwụ ụkwara nwere codeine ihe dịka otu puku naira (N1000) mana ugbua ọ na-adazị bido n'otu puku na narị naịra ise rue puku naira abụọ (N1500-N2000)
Nchọpụta BBC mere gosiri na ọtụtụ ndị na-ere ọgwụ ahụ anaghị ekweta na ha nwere ya kama ha na-ere ya na nzuzo.
Ọtụtụ ndị na-ere ọgwụ ekweghị na ha nwere ọgwụ ahụ maka na 'gọọmentị machiri ya', ọtụtụ jụkwara ikwu okwu gbasara ya ka BBC gbara mbọ ịgba ha ajụjụ ọnụ.
Otu onye na-ere ọgwụ na Kano bụ Ben Udeogwu, katọrọ gọọmenti etiti maka mmachi ahụ.
Udeogwu gwara onye ntaakụkọ BBC na mmachi gọọmenti machiri ọgwụ ụkwara nwere codeine bụ iji okwute egbu anwụnta n'ihi na o mere ka ndị na-ere ya na-erezi ya n'azụ ụlọ ma wetara ndị na-arịa ụkwara siri ike ntaramahụhụ n'ihi na ọgwụ gọọmentị jiri tichie codeine anaghị arụru ọrụ dịka codeine.
Ọ sịkwa na "Ihe na-eme bụ na ndị mmadụ ka na-achọtakwa ya maka na ọrịa na-arịa mmadụ akwụsịbeghị.
"Ugbua e mechiri ya ọ bụrụ na mmadụ rịawa ụkwara ọkpọnkụ, gịnị ka onye ahụ ga-eji gwọọ ya?"
Ụfọdụ ndị mmadụ na-akatọkwa mmachi ahụ gọọmentị machiri ọgwụ codeine na soshal midia sị na ọ gaghị akwụsị oke ọṅụṅụ ya iji merie onwe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Cheta na BBC wepụtara akụkọ so nchọpụta nzuzo ha meere nke gbara n'anwụ ka ụlọọrụ atọ a si jiri ụzọ azụ ụlọ na-eresi ọgwụ a nke e mere n'iwu ka a na-ere naani oge dọkịta nyere akwụkwọ, nye ndị ntorobịa agharaaghara.
Akụkọ ahụ mere ka gọọmenti machie ịtụbata codeine maọbụ ire ọgwụ ụkwara e jiri codeine mee. E mechikwara ụlọrụ atọ ndị a rụrụ aka n'akụkọ ahụ BBC wepụtara.

Akụkọ ga-amasị gị:










