Codeine ọtọmegbum: Emzor achụọla ndịọrụ

Nwata nwoke na aṅụ ọgwụ ọgwụ ụkwara,copdeine

Ebe foto si, BBC

Nkọwa foto, Akụkọ na-ekwu na ụfọdị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eke ndị ntorobịa ọgwụ dịka ihe onyinye
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Naịjirịa bụ, Emzor Pharmaceuticals,achụọla otu onyeọrụ , ma kwụsịkwa abụọ ọrụ n'ike n'ihi aka ha tinyere n'ire ọkwụ ụkwara codeine, n'ụzọ megidere iwu, dịka akụkọ nchọpụta nke BBC mere nke gosiri ka ọgwụ ụkwara ahụ sị ala ndụ ndị ntorobịa Naịjirịa n'iyi.

Emzor chụrụ onye otu onye ọree ahịa ha nke resiri onye ntaakụkọ BBC ọgwụ, Emzolyn syrup.

Ha kwuru nke a na igwe okwu soshal midia ka BBC wepụtachara ihe onyonyo ha mere n' ụbọchị Monde abali 30 nke ọnwa Epreelu.

N'ime ihe onyonyo ahụ zuru otu elekere, e gosịrị otu ndị ahịa ọgwụ ndị gụnyere otu onye ọrụ Emzor ji ụzọ azụlọ na-eresi ndị mmadụ ọgwụ ụkwara.

Iwe na ọnụma juru ndị bịara nkiri ihe onyonyo ahụ nke egosiri na Legos ụnyaahụ

Otu onye kwuru na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-etinye mmanụ n'ọkụ a na-agba na Kano dịka o kwuru na ha na-eke ndị ntoroọbịa ọgwụ a dịka ihe onyinye.

Mana ụlọọrụ Emzor agọọla na ha anaghị ere ọgwụ n'ụzọ n'ezighi ezi.

Ha kwukwara na ha akwụsịla ire Emzolyn nwere Codeine rue mgbe ha ga-emecha nyocha n'ime ebubo na ha na-ere ọgwụ ụkwara ha n'ụzọ akwụghị ọtọ.

Emzor kwụsịburu one oreeahịa ha ma meecha chụọ ya n'ọrụ.

"Emzor Pharmaceuticals bụ ụlọọrụ na-akwanyere onwe ya ugwu ma na akwụwa aka ya ọtọ. nke nwere akwụkwọ ikike ire ọgwụ karịrị otu narị na iri abụọ nke gụnyere Emzolyn Codeine n'aka NAFDAC. "

Ha gara n'ihu sị: A kwụsịla nkesa Emzolyn Codeine yue mgbe a ga-emecha nyocha zuru oke.''

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Na mkparịtaụka BBC na onyeisi ngalaba n'ahụ maka nhazi ọzụzụ na ọrụ ndị omeeọgwụ (pharmacists) na Naịjirịa na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ J.C Okafor nwere.

O kwuru sị na e nwere iwu na-echekwa ka esi ekesa ọgwụ ụkwara nwere codeine, ma kwụwa n'ụlọọrụ ọbụla achọpụtara na ha na-ekesa ya n'ụzọ ezighị ezi, a ga-emechi ya.

Okafor sị,"Anyị nwere atụmatụ etu e ji ekesa ọgwụ ụkwara nwere codeine na Naijiria nke meere na mmadụ enweghị ike ịzụ ya na-ejighị akwụ onye dọkịta. Ụlọọrụ ọbụla a chọpụtara dara iwu ahụ, anyị na-emechi ya."

Otụtụ ndị Najiria nọ na choal midịa na-ata Emzor ụta maka aka ha ndị na nsogbu oke ịṅụ ọgwụ ụkwara dị n'etiti ndị na-eto eto.

Otu onye jụrụ ụlọọrụ ahụ sị : Ya mere, ọ bụrụ na ụlọọrụ BBC egosighị nchopụta ahụ, ụlọọrụ unu agaghị eme ihe ọ bụla iji kwụsị oke ịṅụ ọgwụ a n'etiti ndị ntoroọbịa?

Ọ bụ na ndị ọrụ ụnụ amaghị ihe ha na-eme?

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Onye ọzọ, Mairo Mandara, kpọrọ oku ka gọọmenti machie orire ọgwụ ụkwara nwere codeine.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3