Sweet sweet codeine: Nafdac emechiela ụlọọrụ ọgwụ atọ na-arụ codeine

Ngalaba na-ahazi nlekọta nri na mmepụta ọgwụ bụ Nafdac n'aha ịchafụ emechiela ụlọrụ ọgwụ atọ; Bioraj Pharmaceutical Limited , Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd na Peace Standard Pharmaceutical Limited bụ ụlọọrụ a rụrụ aka n'ihe gbasara ire ọgwụ ụkwara nwere codeine n'ụzọ megidere iwu.
BBC wepụtara akụkọ so nchọpụta nzuzo ha meere nke gbara n'anwụ ka ụlọọrụ atọ a si jiri ụzọ azụ ụlọ na-eresi ọgwụ a nke e mere n'iwu ka a na-ere naani oge dọkịta nyere akwụkwọ, nye ndị ntorobịa agharaaghara.
N'akwụkwọ ozi onyeisi Nafdac bụ Mojisola Adeyeye wepụtara, mmechi a sotara nchọpụta ha mere dịka ha gachara n'ụlọọrụ ndị ahụ.
"N'ihi e nwetaghị ihe akaebe zuru oke na mbọ igbochi iwepụta akwụkwọ kwesịrị oge anyị mere nyocha anyị n'ụbọchị 2 nke ọnwa Mee, n'ụlọọrụ ha dị n'Ịlorin na Lagos, ọ dị mkpa ka e mechie ụlọọrụ mmepụta ahịa ụlọọrụ atọ ndị a - Peace Standard Pharmaceutical Limited ; Bioraj Pharmaceutical Limited na Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd . Nke a bụ iji nye ohere maka nchọpụta zuru oke."

Ebe foto si, @DGatNAFDAC
Adeyeye kwukwara na imepe ụlọọrụ ndị a ga-agbado ụkwụ ka ụlọọrụ ndị a si nye Nafac nkwado na nyocha ha.
O kwuru na otu Nafdac nke gụnyere ndị ọrụ itoolu; abụọ bụ ndị na-enyocha ọgwụ na asaa bụ ndị nchọpụta n-ahụ maka idewe iwu na ndị uweojii iri gara Ilorin n'ụbọchị ahụ, ị ga mee nyocha ụlọọrụ abụọ e nyere ikike ime ọgwụ ụkwara nwere codeine, ndị a kpọrọ aha n'akụkọ nyocha nke BBC wepụtara.
Dika Adeyeye siri kwuo, otu ndị ahụ bụkwa ndị e zigara n'ụlọọrụ Emzor na Lagos.
O kwuru: "Isi ozi e zigara ha bụ ị ga lele akwụkwọ oriri na nkesa ọgwụ ụkwara nwere codeine nye ndị na-aṅụ ya."
O kwuru na Nafdac akpọọla oku nzụkọ ndị ihe gbasara ọgwụ metụtara.

Akụkọ ga-amasị gị:










