Onyeisiala Buhari agala London ọzọ maka njem ahụike

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-apụ taa gawa London ebe ọ na-anata ọgwụgwọ maka ahụ na-arịa ya.
Akwụkwọ onyenkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu dere kwuru na onyeisiala ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ na ya bụ njem.
O kwuru na oge onyeisiala gara London maka mmezi na ịgbanye mmanụ n'ụgbọelu ya oge o si mba Amerịka alọta, ya na dọkịnta ya mere nzụkọ.
O kwuru na dọkịnta ya gwara ya ka ọ bịaghachi nke onyeisiala kwere ya nkwa na ọ ga-abịa.
Onyeisiala ga-alọta ụbọchị Satọde abalị iri na abụọ ọnwa a bụ Mee.
Shehu kwuru na ọ lọta, ọ ga-aga leta Jigawa steeti, njem e bugharịrị maka nzụkọ ndị APC na wọdụ.
Njem ahụ ga-emezi ụbọchị Monde 14 na Tuzde 15 ọnwa a bụ Mee.
Cheta na onyeisiala na-anata ọgwụgwọ na London mana ọ gwaghị Naịjirịa aha ihe na-arịa ya.

Akụkọ ga-amasị gị:










