Gọọmenti amachiela ọgwụ ụkwara nwere codeine

Aha onyonyo, Codeine, ọtọmegbum

Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike enyela iwu ka NAFDAC bụ ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ na Naijiria machie inye ikike ịtụbata codeine na Naijiria maka ime ọgwụ ụkwara.

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Ịsaac Adewole meere ka amata nkea n'ụlọọrụ n'abụja n'ụbọchị Tuusde.

Mịnịsta Ahụike bụ Isaac Adewole

Ebe foto si, Isaac Adewole/Facebook

Ọ sị na ihe mere o jiri dị mkpa ịmachi ọgwụ nwere codeine bụ maka mkpamkpa oke ịṅụ ọgwụ a na- akpa na Naijiria ọkachasị n'Ugwu-Awụsa.

O nyekwara iwu ka PCN na NAFDAC lebanye anya n'ịkpọghachị ọgwụ ụkwara nwere codeine.

Cheta na akụkọ nchọpụta nke BBC mere gosiri ka ọgwụ ụkwara nwere codeine si akpa mkpamkpa na ndụ ndị ntorobịa Naịjirịa.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ