Aisha Buhari etiela mkpu maka ihe codeine na-eme n'ugwu awụsa

Aisha Buhari

Ebe foto si, Aisha Buhari Facebook

Nkọwa foto, Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari etinyela ọnụ n'okwu banyere ọgwụ ike na Naịjiria dịka ihe onyonyo BBC mere maka ya pụtara.

Ihe nkiri nke ndị na-eme nyocha na BBC bu ndị a kpọrọ 'African Eye', gosiri n'ụbọchi Monde ziri na ụfọdụ n'ime ndị na-arụ ọrụ na ụlọ rụ a na-emepụta ọgwụ na Naịjirịa tinyere aka na ire ọgwụ ụkwara nwere Codeine n'ụzọ ezighị ezi.

Otu n'ime ụlọọrụ ndị akwụsịla ire ọgwụ ukwara Codeine ha, ka ụlọọrụ ọzọ na-agọsị ike na aka ha adịghị na ajọ ihe a.

Oriakụ Buhari, na ozi o dere na akara Instagram ya, sị na iwe were ya mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ na adaba na iṅụ ogwu ike, okachasị ka o bu nne.

O sị na ihe na-eme kachasi n' Ugwu Awụsa, ebe ọ sị na nwunye ndị gọvanọ steeti dịgasị ebe ahụ tinyere aka ịrụgharị ụlọọgwụ n'ebe a na-agwọ ndị ọgwụ ike na-enye nsogbu na Kogi na Kebbi.

N'ubọchi Monde, otu n'ime ụlọ ọrụ kachasị na-imepụta ogwu bụ Emzoe Pharmaceutical kwuru na ha na enyocha ihe BBC chọpụtara.

Ọgwụ ụkwara Emzolyn ha na emepụta pụtara na ihe onyonyo a BBC mere. Otu onye na erere Emzor ọgwụ pụtara n'i,e ihe onyonyo ka ọ na-etu ọnụ na ya ga-ere akpati ọgwụ ụkwara nde n'izu ụka. Achụọla ya n'ọrụ.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Codeine bụ ọgwụ na-tọkụrụ atọkụrụ enwere ike re sọsọ ma dọkịta onyere akwụkwọ. Mana, akwụkwọ gọomentị dere na nso a, na-atụ aka na ihe ruru ọgwụ ọkwara iko nde atọ ka a na-aṅụ kwa-ụbọchị na sọsọ steetị abụọ n'ugwu awụsa.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ