Bianca Ojukwu: APGA ga-ata ahụhụ ihe mere na ntuliaka imeụlọ ha

Ebe foto si, Facebook
Bianca Ojukwu, nwunye Dim Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu nwụrụ anwụ, ekwuola na otu APGA ga-enweta ụgwọ ọrụ ihe ha mere na ntuliaka imeụlọ ha na ntuliaka na-abịa.
Bianca zọrọ ọkwa onye ga-anọchiteanya ndị Anambara-Saụt n'ụlọomeiwu nke ukwu mana Nicholas Ukachukwu meriri ya.
O kwuru na e ji aghụghọ kpapụ ya na ndị ọzọ so bido pati ahụ.
N'akwụkwọ ozi nke o binyere aka, Bianca boro ebubo na pati ahụ abanyela n'aka ndị ọjọọ nke mere na pati ahụ na-achọzị ikpula ka ero.
"Dịka otu onye so nọrọ n'isioche nlekọta pati, ọ na-ewute m na aka ndị ọjọọ akparala pati anyị.
"Taa, APGA na-atụ n'ume, ebe aha ya dakpọcharala.
"Nke a ga-enyerịrị ha ntaramahụhụ na ntuliaka na-abịa."
Mana ọ kpokuru ndị e mejọrọ na ntuliaka imeụlọ ahụ ka ha ghara ịhapụ pati ahụ n'iwe.










