Bianca Ojukwu: APGA ga-ata ahụhụ ihe mere na ntuliaka imeụlọ ha

Bianca Ojukwu

Ebe foto si, Facebook

Nkọwa foto, Bianca Ojukwu bụ nwa aka chịbụrụ Gọvanọ Anambara steeti ochie bụ Christian Onoh

Bianca Ojukwu, nwunye Dim Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu nwụrụ anwụ, ekwuola na otu APGA ga-enweta ụgwọ ọrụ ihe ha mere na ntuliaka imeụlọ ha na ntuliaka na-abịa.

Bianca zọrọ ọkwa onye ga-anọchiteanya ndị Anambara-Saụt n'ụlọomeiwu nke ukwu mana Nicholas Ukachukwu meriri ya.

O kwuru na e ji aghụghọ kpapụ ya na ndị ọzọ so bido pati ahụ.

N'akwụkwọ ozi nke o binyere aka, Bianca boro ebubo na pati ahụ abanyela n'aka ndị ọjọọ nke mere na pati ahụ na-achọzị ikpula ka ero.

"Dịka otu onye so nọrọ n'isioche nlekọta pati, ọ na-ewute m na aka ndị ọjọọ akparala pati anyị.

"Taa, APGA na-atụ n'ume, ebe aha ya dakpọcharala.

"Nke a ga-enyerịrị ha ntaramahụhụ na ntuliaka na-abịa."

Mana ọ kpokuru ndị e mejọrọ na ntuliaka imeụlọ ahụ ka ha ghara ịhapụ pati ahụ n'iwe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: