Fayose awuchiela ụlọọrụ EFCC

Ebe foto si, Lere Olayinka
Ọ bụ tata ka njem Fayose gwụrụ dịka aka na-achị Ekiti steetị ka echere onye nọchiri anya ya bu Kayode Fayemi iyi na Ado Ekiti.
Nke a pụtara na iwu machiri ịnwụchị Fayose maka mpụ na nrụrụ aka ngalaba ụdịri mmehe a dị n'aka ha bụ Economic and Financial Crimes Commision (EFCC) boro ya emebiela.
Fayose, bụ onye EFCC na-achụ kemgbe tupu ọ lagachite n'okwa gọvanọ, ejirila aka ya ga za oku n'ụlọọrụ EFCC.
Cheta na ụnyaahụ Fayose si na ọ ga-ebu ite ya na akwa ndina niile ya gaa zara ọnụ ya taa.
Nke a emela ugbua ka Fayose wuchiri ụlọọru EFCC nke oche.
Nke mere ndị mmadụ kpụ n'ọnụ bụ uwe Fayose yi ga ya bu njem bu nke e dere "EFCC awụchiela m".
Ọtụtụ mmadụ na Soshal Midia kwadoro ihe Fayose mere, dịka Maazi Joe Abah kwuru na ọ bụ ihe eji ama atụ na o gara n'aka ya:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana onwere ndị si na ọ bu onye ụka ọchị, dịka onye nwe akara @muuzzy644:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Dịka o kwụ ugbua, amabeghi ma EFCC ọ ga-anwụchị Fayose dịka ha mere ụfọdụ ndị ọzọ ha boro mpụ, mana nwa amadị ahu kwadoro akwado.









