Igbo History: Edward James Roye, Onye Igbo bụbu onyeisiala mba Liberia

Ị ma na o nwere nwa afọ Igbo chịburu dịka Onyeisiala mba Liberia aha ya bụ Edward James Roye?
Roye bụ aha nwa Igbo sitere na mba Amerịka tụrụ ugo ma bụrụ onyeisiala nke ise nke mba Liberia.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu gbasara akụkọ mere eme na mba Liberia bụ Ọkammụta Samuel T. Kortu onye bụ onyeisi ngalaba Akụkọ Mgbe Gboo na Mahadum Liberia, na Mazi Reginald Goodridge bụ onyeisi otu ndọrọndọrọ True Whig Party dị na mba Lịberịa nke Edward James Roye bidoro tupu ọ nwụọ bụ ndị tinyere ọnụ n'edemede a.
Ode akwụkwọ a ma ama mgbe ochie bụ William Du Bois dere akwụkwọ maka ndụ Edward James Roye, ebe ụfọdụ ozi ị ga-enweta n'akụkọ a siri bata.
Akụkọ a ga-egosi gị etu Roye si gosipụta na n'ezie; "Igbo Amaka".
Etu Edward James Roye siri too
Samuel T. Kortu kwuru hoohaa sị "Eee Edward James Roye nwere agbụrụ ndị Igbo".
Goodridge kọwara na a mụrụ Edward James Roye n'ụbọchị atọ nke ọnwa Febuarị afọ 1815 n'obodo Newark na mpaghara Lincoln dị na steeti Ohio nke mba Amerịka.
Aha nna ya bụ John Roye kama onweghị ebe akụkọ ọbụla kpọrọ aha nne ya.
Akụkọ na-ekwu na nna ya bụ John Roye bu ezigbo nwaafọ Igbo e jidere ma repụ dịka ohu na mba Amerịka.

John Roye gbara mbọ ma mechaa nwere onwe ya wee malite ọrụ ịkwọ ụgbommiri na-ebu ndị mmadụ agafe mmiri Terre Haute.
Nwoke a sitere n'ọrụ ụgbọmmiri a bụrụ ogaranya ma zụta ala na akụnụba ndị ọzọ dị iche iche.
Ọ bụ site na mbọ nna James Roye gbara ka o ji zịga ya ụlọakwụkwọ n'obodo Ohio.
Du Bois dere na Roye gara Mahadum nke Athens dị n'Ohio afọ atọ ma rụọ ọrụ nkuzi n'obodo Chillioothe.

Ebe foto si, Getty Images
Du Bois dekwara na Roye tinyere uchu n'ịzụ ahịa atụrụ ma mechaa lekọta ụlọ ahịa.
Akụkọ ndị ọzọ na-ekwu na Roye mere nke ọma n'azụmahịa ma bụrụ onye nwere ebe a na-akpụ isi kachasị n'obodo Terre Haute ebe ọlaghachiri mgbe nna ya nwụrụ n'afọ 1836.
Akwụkwọ Du Bois kwuru na ọ bụ mgbe nne ya nwụrụ n'afọ 1840 ka Roye bidoro itule ịhapụ Amerịka gaa mba ọzọ n'ihi ịkpa oke agburu na mkpagbu ndị isiojii.
Ọ kọwara na ọ bụ mba Haiti ka Roye chọburu ịga nke mere ka ọ mụọ asụsụ Frenchị, mana mgbe ndị ngalaba American Colonization Society mara ọkwa ka ndị isiojii gaa biri na mpaghara ọdịda anywanụ Afrịka, Roye mere njem ya gawa Liberia.
Roye lụrụ nwaanyị na mba Amerịka tupu ha abụọ agawa Liberia n'afọ 1846 oge ọ dị afọ iri atọ n'otu.
Ndụ Edward James Roye na Laịberịa
W.E.B Du Bois dere n'akwụkwọ ya na Roye bu ụfọdụ ngwaahịa wee bata mba Laịberịa.
Du Bois kọwara na Roye gbara mbọ ma mee nke ọma n'azụmahịa nke mere ka edepụta aha ya dịka onye kacha nwee ego na mba Laịberịa n'afọ 1870.
N'otu aka ahụ Goodridge kwukwara na Roye bidoro azụmahịa na Laịberịa ma nwekwaa ọtụtụ ụgbọmmiri o ji azụ ahịa.
O kwukwara na Roye bụ onye ntaakụkọ na-ebipụta akwụkwọ mgbasa ozi a kpọrọ 'The Liberian Sentinel'.
Njem ya n'ime ndọrọndọrọ ọchịchị na Liberịa
Du Bois dere na Roye onyeisi nke ụlọomeiwu Liberia n'afọ 1849, ma rụkwa ọrụ dịka ọkaikpe kachasị nke Laịberịa site n'afọ 1865 ruo afọ 1868.
Goodridge kwuru na ọ bụ Roye bidoro otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọ kpọrọ "True Whig party" maọbụ "Liberian Whig Party" n'afọ 1869.

Ebe foto si, THE TRUE WHIG PARTY - The New Generation/Facebook
N'oge ahụ, na ọ bụ nanị otu ndọrọndọrọ a kpọrọ 'Republican Party' ka e nwere na Liberia.
Naanị ndị nwere agbụrụ ndị ọcha bụ ndị na-akwado otu Republican ebe ndị isiojii na-akwado 'True Whig Party'.
Onyeisiala nke ise mba Laịberịa
Goodridge kọwara na mgbe Roye bidoro 'True Whig Party', a nwụchiri ya na ndị otu ya ma bo ha ebubo ịgba gọọmentị mgba okpuru.
Mana Roye na ndị otu ya meriri ya bụ ikpe nke mere ka o soro zọọ ọkwa onyeisiala Liberia 1869 ma merịe.
E duru Roye n'iyi ọrụ n'afọ 1870, o wee bụrụ onyeisiojii mbụ bụụrụ onyeisiala mba Laịberịa ma bụrụkwa onyeisiala nke ise.
Ọchịchị ya dịka onyeisiala Laịberịa
Goodridge kwuru na Roye mere ka otu 'True Whig' bụrụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke na-anabata mmadụ niile na Laịberịa.
O kwuru na nke a mere ka ya bụ otu gbasie ike.
Du Bois kwuru na Roye wepụtara atụmatụ ga-ebute ọganịhu nke gụnyere mmegharị akụnụba obodo, agụmakwụkwọ nakwa mmezi okporoụzọ.
Roye chọpụtara na Laịberịa enweghị ego imezu ihe niile ọ kwesiri ime, o wee gaa mbibi ego nke bụ ebe nsogbu ya si malite.
Ihe mere eji wepụ ya n'ọchịchị
Edward James Roye chịrị nanị otu afọ tupu e wepụ ya n'ọchịchị.
Du Bois kọwara na Roye gara ibite narị puku paụnd ise (500,000 pounds) n'aka mba Briten.
Roye nyekwara iwu ka e were ụfọdụ ego o bitere were tụbata ngwa ahịa.
Mana Roye akọwaghịrị ndị omeiwu nkwekọrịta niile ya na mba Briten kwekọrịtara gbasara ya bụ mbibi ego.
Nke a mere ka Liberia nyefee ndị Briten ala agwaetiti (Island) ha zụtara n'efu.
Ihe kacha kpasuo ndị mmadụ iwe bụ mgbe Roye chọrọ ịdọtị afọ abụọ o kwesiri ịchị dịka onyeisiala site n'ịmepụta iwu ga-akwado nke a.
Ọ bụ nke a mere ka ha chụpụ ya na ndị enyi ya n'oche ọchịchị, napụ ya ụlọ ya ma tinye otu nwa ya nwoke na nga.
Ndị ụlọomeiwu n'oge ahụ chụpụrụ ya dịka onyeisiala n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Oktọba afọ 1871.
Ọnwụ Edward James Roye
Enweghị onye ma ugbu a etu Roye siri nwụọ.
Goodridge kọwara na ụfọdụ na-ekwu na e gburu ya egbu mgbe e wepụrụ ya n'ọchịchị.
Ndị ọzọ na-ekwu na e kere ya eriri ma dọkpụrụ ya n'okporo ụzọ, mechaa tụnye ya n'ime mmiri.
Akụkọ ọzọ na-ekwu na Roye chọrọ igwuru mmiri gbaga ebe ụgbọ mmiri ya nọ kama akpa ego ọ kere n'ukwu mere ka mmiri rie ya.
Nke mere ruo taa ndị Laịberịa na-ekwu "Weight weight kill Roye".
Du Bois kwukwara n'edemede ya na ọ bụ mmiri riri Roye.
Ma rukwa taa, otu True Whig Party ka dịkwa ndụ na mba Laịberịa.













