Igbo History: Ndị Igbo sị na ha abụghị Igbo na ihe kpatara ya

Ndi jiri ejiji ka ndị Igbo

Ebe foto si, Tony Awunor

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

E kwube okwu banyere ndị Igbo, a na-atụkarị aka na ndị bị n' Ọwụwa Anyanwụ Naijiria nke gụnyere Abia, Anambara, Ebonyi , Enugwu na Imo steeti.

Mana Igbo dịka akwụkwọ ụkpaka, ha gbasara ebe niile na ndịda Naijiria rue Niger-Delta nakwa etiti Ugwu Naijiria.

Ndị ma ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara ahụrụ na ebe ndị si, na-akọwa na ndị Igbo nwere mmadụ na a gafee mmiri Naija ebe e kwuru na ihe karịrị pasent iri abụọ na ise na steeti Delta bụ ndị Igbo.

Otu ahụ ka ọ dị na Rivas, Kros Riva,Akwa-Ibom na Bayelsa bụcha ebe asụsụ,omenala na ejiji obodo ụfọdụ na steeti ndị a na-egosi na ọbara anaghị agha ụgha.

Ndị a bụ ndị nwere njirimara na nkwenye ndị Igbo nke gụnyere ibi ugwu, ịlọ ụwa na ịgọ ọjị.

Na Delta steeti,agbụrụ bụ Igbo gụnyere :

Na Delta steeti

1.Oshimili

2. Ndokwa

3. Ukwuani

4. Aniocha

5. Ika

Na Rivas steetị, ụmụ afọ Igbo nọ na Rivas gụnyere;

1. Ikwerre( Rotimi Amaechi, Patience Jonathan si Ikwerre)

2. Opobo

3. Omuma

4. Ndoni

5. Obigbo

6. Rumuokoro bụ Umu okoro

7. Rumuigbo bụ Ụmụ Igbo

8. Rumuibekwe bụ ụmụ Ibekwe

Na Bayelsa, ndị bu ọbara Igbo na Bayelsa steeti ọkachasi mpaghara Sagbama gụnyere;

1.Osekwenike

2. Eke Okpokri

3. Abuetor

Ndị dịka ndị Ichie

Ebe foto si, Anthony Awunor

N' Edo steeti

Ọ dịka ọ bụ akụkọ ifo, mana e nwere Igbo na

1. Igbanke/Igboakiri

Ya mere ị nwere ike ị na-anụ ndị na-aza aha Igbo a gwọkọtara ya na aha ndị Edo.

N' Akwa-Ibom steeti

Ụmụafọ Igbo nọ ebe ahụ gụnyere ndị

1. Ikot Udo Ika dị n'okpuru ọchịchị Ika,na steeti ahụ.

Na Krọs Rivas

1. Isobo nọ n' okpuru ọchịchị nụ ụmụ Igbo.

Na Benue steetị

I sonyeere na ndị na-ekpọkọta ndị Benue kpọ ha 'ndị Ugwu'? Mata na ndị Igbo nọ na steeti ahụ gụnyere ndị nọ n' okpuru Ọchịchị dịka;

1. Okpoku

2.. Obi

3. Oku

4. Adọ

Ihe ndị mere ụfọdụ Igbo ji sị na ha abụghị Igbo

Ndị na-eme emujme ọdinala Igbo

Ebe foto si, Anthony Awunor

1. Agha Biafra

Ngọnarị ụfọdụ Igbo na-agọnarị ndị Igbo gbanyere mgbọrọgwụ n' Agha Biafra.

Ndị Igbo bụ ndị e meriri n'Agha Naijiria a lụrụ site n'abalị isii nke ọnwa Julaị afọ 1967 rue Januwarị afọ 70.

Agha ahụ tara isi mmadụ ruru nde atọ na ụma. Onye dara ada enweghị onye na-ekwe na ọ bụ nwanne ya.

Otu onye ihe gbasara olu ndị( Linguist) bụ Anthony Awunor kọwara sị," ka a lụchara agha, ndị Igbo tara ezigbo ahụhụ ma rịakwa ọrịa nke a mere ka a na-asọ ha asọ."

2 Okike steeti ga

Ọ bụ okike steeti mere e jiri kenye ọtụtụ ụmụafọ kwesịrị isonye na steeti dị n'Ọwụwa anyanwụ na steeti ndị ọzọ.

Ọmụma atụ: Ụfọdụ Obodo dịka Amaezekwe, Umuoghara, Amaekka, Umuezeokoha, Umuezeoka, Oriuzor, Umuoghara bụ ndị kwesiri ị nọ na Benue steeti mana e kenyere ha na Benue steetị.

Okpuru ọchịchị Ado, Oju, Obi dị na Benue steeti bụ obodo nọ onwe ha tupu ndị ọcha abata Naijirịa.

Cheta na iji hụ na a kwara Ojukwu nku na mbido Agha Biafra, onyeisiala Naijiria oge ahụ bụ Yakubu Gowon kepụtara steeti iri na abụọ na mpaghara atọ dị na Naijiria, n'abali ise nke ọnwa Mee afọ 1967.

N'ụzọ ka e siri tinye nkewa n'etiti ndị Igbo nọkọtarburu ọnụ dịka ụmụnne n'otu mpaghara "Eastern Region."

3. Egwu na ndị Igbo ga-awọ ha oke ha

Ọtụtụ ndị Igbo anọghị n'etiti Ọwụwa Anyanwụ na-atụ uche na a hapụ ha na ndị Igbo( etiti), ha agaghị ekwe ka oke ọbụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo rute ha aka.

Awunor rụtụrụ aka na ọ bụ iji dajụọ egwu ahụ mere na Ohaneze mere onye Anioke nụ Ralph Uweche, onyeisi otu Ohaneze n' oge gara aga.

" Mana nke a ewepụghị egwu ndị Igbo."

4. Akụkọ ndị gboo kọrọ ha

Aha onyonyo, Kedu ebe Igbo si?

Ọtụtụ ndị Igbo bi na Rivas ekwenyeghị na o nwere sakramentị jịkọrọ ha na ndị Igbo n'ihi akụkọ ndị gboo ha kọrọ.

Akụkọ ntọala ndị Igbo na-ekwu na ndị Igbo si Nri dị n'Anambara were gbasaa n'akụkụ ụwa dị iche iche.

Mana ndị Igbo nọ na Rịvas nakwa ụfọdụ Delta na-ekwu na ha si Bini dị n'Edo steeti were gbasaa rue ebe ha bi ugbua.

Aha onyonyo, Igbo Origin: Aguleri na Nri na-azọ ndị bụ isi Igbo - Nke Ikpeazụ

Ngozi Zibby Orlukwu, onye Ikwerre sị na "Akụkọ kwuru na anyị si na Edo gaarue na ndịda anyanwụ ebe a kpọrọ 'South' na Bekee."

"Ndị Igbo ka nwee ọnụọgụgụ mmadụ karịa ndị Ikwerre. Akwụkwọ nso bụ na Igbo ka e dere ya, ya mere ọtụtụ ndị Ikwerre oge gbọọ bụ akwụkwọ nsọ Igbo ka ha na-agụ."

Orlukwu, onye bụ onye ntaakụkọ kwuru na ọ bụ mmekọrịta azụmahịa na ịlụkọ di na nwunye bụ ihe mere ndị Ikwerre ụfọdụ ji anụ Igbo.

"Mana ọ bụrụ na onye Ikwerre suo Ikwerre, onye Igbo agaghị anụ ihe ọ na-ekwu."

O kwuru na ihe na-ewekarị ndị Ikwerre iwe bụ ndị Igbo ị na-asị na ha bụ Igbo, ebe ha nwere omenala ha nke dị iche na omenala ndị Igbo.

"O nweghị onye ga-akọrọ gị onye ị bụ karịa gị."

Ndọrọndọrọ ọchịchị

Dịka Orlukwu si kwuo, ọtụtụ ndị Igbo ji ekwu na ndị Ikwere bụ nwanne ha bụ n'ihi na anya ha dị n' akụ ọnatarachi dị na mpaghara nke ha.

"Ọ bụrụ na o nweghị ihe ndị mpaghara anyị nwere, ikekwa ndị Igbo agaghị asị na anyị na ha bụ nwanne."

Mana e tere ogiri, e tere ụgba, na-agbanyeghị n' ụfọdụ ndị a na-arụ aka n'agbụrụ ndị ọzọ dịka ebe ha siri lọ ụwa, asụsụ ha, omenala ha na ejije ha na-egosi na ọbara ha bụ nke Igbo na enweghị mgbagha ọbụla.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị: