George Floyd: Ihe ọhụrụ ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya na Thomas Lane, J. Alexander Kueng

Ebe foto si, Twitter/Ruth Richardson
Ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia na-ekwu uche gbasara ihe igwe eji ese foto otu onye n'ime ndị uweojii nwụchirị ya setere tupu ọ nwụọ.
Ụfọdụ n'ime ha na-ekwu na onyonyo ahụ gosiri na Floyd achọghị ndị uweojii ahụ okwu kama ndị uweojii niile so nwuchie ya so wee gbu ya bụ nwamadị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@RealBrysonGray kwuru na agwaghị ndị mmadụ eziokwu gbasara ọnwụ George Floyd.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@UsernameMcgee kwuru na ụfọdụ ihe ekwuru maka onyonyo ahụ e gosiri na-egosi ikpa oke agbụrụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Oku ka a kwụsị ịkpa oke agbụrụ bụ ihe kpọtụrụ n'akwamozu ya
Oku ka a kwụsị ịkpa oke agbụrụ bụ ihe rịrị ibe ya elu n'akwamozu George Floyd bụ onye ndị uweojii mba Amerịka pịgburu n'ihu ọha na nso nso a.

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị kwuru n'ụlọụka na Houston, Texas ebe e mere ofufe nro maka ọkwụ ya chetara "nwoke mpụ o mere bụ na ọ bụ onye isi ojii."
E buru ozu ya si n'ụlọụka gawa ebe a na-eli ozu a kpọrọ Houston Memorial Garden bụ ebe e liri ya n'akụkụ nne ya.

Otu n'ime ṅwa nwanne Floyd bụ Brooke William kpọrọ oku ka agbanwee iwu ndị na-emegide ndị isi ojii.

"Iwu dị adị bụ nke e mere ji kwaada ndị isi ojii. E kwesiri ịgbanwe ya."

Ebe foto si, Getty Images
N'ozi nke onye na-azọ ọkwa onyeisiala bụ John Biden zitere n'ihe onyonyo o kwuru sị, "ọ bụrụ na-enye George Floyd ikpemkwụmọtọ, oge ahụ ka anyị ga-ama n'anyị eruola n' ikpemkwụmọtọ nye agbụrụ ọbụla."

Mara na kemgbe e gburu ya n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Mee, ngagharịiwe a na-eme na mpaghara ụwa dị iche iche bụ nke ọnwụ ya kpalitere, ebibeghi.
Ihe ndị 'Democrats' mere
Ndị ụlọomeiwu nta Amerịka nọ na pati Democrats buru ikpere n'ala taa dịka ha na-akwenyere George Floyd bụ onye ndị uweojii gburu ugwu nke ikpeazụ.
Ha bikwasịrị ikpere n'ala ruo ihe dịka nkeji itoolu n'ime ụlọomeiwu mba Amerịka.
Mgbe ha mechara nke a, ha kpuhere iwu ọhụrụ a kpọrọ 'sweeping legislation' bụ nke a ga-eji nwogharịa uweojii mba Amerịka.
Iwu a na-abịa n'ime ọrụrụ izuụka a malitere ngagharịiwe n'obodo dị iche iche n'Amerịka maka mkpagbu ndị uweojii na ịkpa oke agbụrụ.
Ọ ga-adị mfe ikpe ndị uweojii ikpe ma kpaa agwa ọjọọ, gbochie ikpa oke agbụrụ nakwa kwụsị mkpagbu ndị uweojii a kpọrọ 'chokehold'.
Ndị omeiwu na Minneapolis aṅụọla ikposasị ndị uweojii n'obodo ahụ.
Ihe niile na-abịa dịka ọnwụ George Floyd ji bute atụmatụ mgbanwe iwu n'Amerịka.
A mabeghi ma ndị pati Repuplican kachasị na Sịneti ọ ga-akwado iwu ọhụrụ a.

Ndị mmadụ gụnyere ndị ezinaụlọ George Floyd gbakọrọ taa bụ Tọzde maka emume ofufe iji cheta ọnwụ ya n'aka ndị uweojii n'abali iri abụọ na ise nke ọnwa Juun, afọ 2020.
E ji abụ ụka nakwa ihe ọgụgụ si n'akwụkwọ nsọ na mmemme ahụ nke e mere na mahadum "Minnesota University."
Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Andrew Elfrenbein nọrọ ebe ahụ kwupụta na ha na-ehiwe agụmakwụkwọ n'efu (scholarship) n'aha George Floyd.

Ebe foto si, AFP
Onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Al Sharpton kwuru n'oge eruola ikwu, "Wepụ ikpere gụ n'olu anyị."

Na nkọwa onye Floyd bụ ụmụ nne ya kwuru okwu kpọrọ ya "mmadụ ọha, "onye hụrụ ndị mmadụ n'anya" na-enye ndị ọzọ aka site na inye ha nri maọbụ ndụmọdụ."
Ndị bịara emume ahụ nọrọ jii nkeji asatọ , ntabianya iri anọ na issi bụ oge onye uweojii ji ikpere pido akpịrị George Floyd n'ala tupu ya anwụọ.

Ebe foto si, Getty Images
Emume ncheta ọnwụ Floyd onye a pịgburu na Minnepolis dị na steeti Minnesota bụ ihe a ga-eme ụbọchị isii dịka ozu ya ga-agazu steeti atọ tupu e lie ya n'ụbọchị nke isii.
Ndị mmadụ ga-enwe ohere ịhụ ya nke ikpeazụ site n'elekere iri na otu nke ụtụtụ ruo elekere otu nke ehihe na "Cape Fear Conference B Headquaters".
Dịka ha sị kwubuo, a gaghị enwe ngagharịiwe oge a na-eme ofufe ncheta George Floyd.
Second degree murder: A kpụpụla ndị uweojii atọ ndị ọzọ aka ha dị n'ọnwụ George Floyd

Ebe foto si, Minneapolis police
Dịka a na-eme emume ofufe maka ncheta ọnwụ George Floyd, ndị okwu dị n'aka anwụchiela ma kpụpụkwa ndị uweojji atọ nọ mgbe onye otu ha pịgburu George Floyd na Mee 25,2020.
George Floyd bụ onye isi ojii otu onye uweojii pigburu na mba Amerịka Monde abụọ gara aga oge ha na-achọ ịnwụchi ya maka ebubo iji $20 adigboroja achọ izu ihe.
N'otu aka ahụ, a kwalitere mkpesa e wepụrụ ụlọikpe megide Derek Chauvin bụ onye uweojii ji ikpere pịgbuo Floyd ka ọ bụrụ nke Bekee kpọrọ 'second degree murder.'
'Second degree murder' bụ igbu mmadụ na akwadoghị ya akwado, na enweghị ihe doro anya ị ga-asị na onye ahụ mere gị.
Ọ bụ ọkaiwu nke gọọmenti nke Minnesota bụ Keith Ellison gbara ama ụbọchị Wenezde oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka.
Ọ bụrụ na e kpegbu Thomas Lane, Tou Thao na J. Alexander Kueng bụ ndị nọ n'ele ka Chauvin pịgburu Floyd, ha anọ na mkpesa, ọ ga-adọtara ha ihe ruru afọ 40 na mkpọrọ.
Mana ihe ndị a niile akputughị iwe ndị mmadụ dịka ngagharịiwe barala abalị iri.

Ebe foto si, AFP
Ngaghariiwe a bakwara mba ndị ọzọ dịka Briten, Naijiria na ebe ndị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images
Donald Trump na ngagharịiwe maka ọnwụ George Floyd

Ebe foto si, Donald Trump, BBC
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya ga-ezipụ ndị agha ịkwụsị ngagharịwe emeela ihe karịrị otu izuụka maka ọnwụ nwoke isi ojii nke nwụrụ n'aka ndị uweojii.
Trump sị na obodo na steeti akwụsịghị ngagharịiwe ahụ na ya ga- eziga ndị agha ka ha gaa"gboro ha ọgụ ahụ ngwangwa."
Ngagharịiwe maka ọnwụ George Floyd bụ onye ndị uweojii pịgburu na Monde abụọ gara aga, na-akawanye njọ.
N'ụbọchị Tuzde, ndị uweojii Las Vegas kwuru na a gbagburu otu onye otu ha ka ndị uweojii na-agbalị ịgbasa igwe mmadụ mgbakọrọ eme ngaghariwe.
Ọtụtụ ndị mmadụ bụkwa ihe merụrụ ahụ dịka ndị ọrụ ji ikuku ose na aka ike achụsasị nsị mmadụ dịka ngaghariiwe ahụ gbasaalara rue obod mepere emepe iri asaa na ise..
N'abali Monde, mgbọ tụrụ ndị uweojii anọ dịka ngahariiwe na-akpọtụ na Louis dị na Missouri.
Nnyọcha maka ọnwụ nke g ọọmentị mere gosiri na ọnwụ Floyd bụ mmadụ kpatara ya dịka o gosiri na o nwere 'obi nfepụ'(cardiac arrest)
Onye uweojii pịgburu George Floyd ga-azara ọnụ ya n'ụlọikpe maka igbu ọchụ

Ebe foto si, AFP via Getty
A nwụchiela onye uweojii pịgburu otu onye isi ojii a ma dịka George Floyd n'obodo Minneapolis dị na mba Amerịka, ma kpụpụ ya ụlọikpe ka ọ gaa zara ọnụ ya maka igbu ọchụ.
Derek Chauvin bụ onye ihe onyonyo gosiri ka o sekpu ala ma tinye ikpere n'akpịrị Floyd, na ndị otu ya atọ, bụ ndị a chụrụ n'ọrụ ụbọchị Mọnde n'ihi ọnwụ Floyd.
Ọnwụ Floyd butere ngagharịiwe na mwakpo nakwa ịgba ọkụ n'obodo ahụ, dịka ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụghị ọrụ e dinyere ndị uweojii ka ha na-arụzị, kama na ọ bụ ịkpa oke ka ọtụtụ n'ime ha na-eme megide ndị isi ojii.

Ebe foto si, Reuters
Mike Freeman bụ onye ọkaiwu na Hennepin County kwuru na a ga-ekpe Chauvin ikpe maka igbu mmadụ na-echeghi ya eche, ma kwuo na a na-enyochakwu ndị uweojii ndị ọzọ nọ ebe ahụ mgbe ihe a mere.
Freeman kwuru na ọ na-atụ anya na a ga-akpụpụkwa ha ụlọikpe ka ha gaa zara ọnụ ha, mana o kwughizi ihe ọzọ gbasara ya.
Ndị mmadụ nọ na soshal midia akpọgbuola onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump maka ịkpọ ndị na-eme ngaghariiwe maka ọnwụ George Floyd, agboro'.
Trump kwuru n'akara Twitter ya na ya agaghị enye ohere ka "ndị agboro" metọọ aha Floyd dịka ya nyerela iwu ka ndịagha were ọnọdụ ịhụ na ha gbara onye ọbụla nwara izu ohi dịka ngagharịiwe na-aga n'ihu.

Ebe foto si, "realDonaldTrump/Twitter
Ndị na-eme ngagharịiwe agbaala ogige ndị uweojii Minnepolis bụ mpaghara ebe ndị uweojii pịgburu otu nwoke isi ojii a kpọrọ George Floyd na mba Amerịka si.
Ha gbakwara ọtụtụ ụlọ ọkụ ma mebikwa ụgbọala iji gosi iwe ha.
Ọgbaghara dara nke abalị atọ dịka ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche na mba Amerika maka ọnwụ Floyd.
Otu onye uweojii ji ikpere pịgbuo Floyd n'ụbọchị Monde oge ya na ndị otu ya na-achọ inwụchi ya maka ebubo iji ego adigboroja($20) chọọ ịzụ ihe.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii mba Amerịka chụrụ ndị otu ha mmadụ anọ ahụ n'ọrụ maka ọnwụ nwoke isi ojii gbara afọ iri anọ na isii bụ onye ndị otu ha pịgburu ka ha na-achọ ị nwụchi ya.

Ebe foto si, Getty Images
Mana ezinaụlọ Floyd sị na nke ahụ ezughị, na ha chọrọ ka a kpụpụ ndị uweojii aka ha dị n'ọnwụ Floyd ụlọikpe.

Ndị uweojii gbara ikuku anyammiri (tear gas) nakwa mgbọ rọba n'obodo Minneapolis dịka ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe gbakọrọ na-eti mkpu ka a kpụpụ ndị uweojii ahụ ụlọikpe taa ha ahụhụ maka igbu onye nọ n'aka ha na-ejighị ngwaọgụ ọbụla.

E mekwara ngagharị iwe na Chicago, Illinois, Los Angeles, California, Memphis na Tennesse.

Ebe foto si, Ruth Richardson/Twitter
Ọtụtụ ndị mmadụ na mbaụwa nọ na soshal midia ji iwe ekwu maka ọnwụ Floyd bụ onye ndị uweojii pigburu na Minnesota dị n'Amerịka dịka ha chọrọ ịnwụchi ya.
Nke a na-eme dịka ihe onyonyo gbara na sochal midia nke na-egosi ka otu onye uweojii ji ikpere pigide olu George Floyd n'ala, ya ana-asụ ude ma na-ekwu, 'Anaghị m ekutezi ume."
Ihe onyonyo nke onye nọ ebe ihe ahụ mere sere gosiri ka e jidere Floyd n'ala, ọ nọkata ya etie, "e gbula m egbu."
Ndị nọ ebe ahụ nọ na-agwa onye uweojii ahụ ka o wepu ikpere n'akpịrị ya, dịka ha hụrụ na George anaghị emegharị ahụ.
Otu onye n'ime ha sị, "imi ya na-agba ọbara." Onye ọzọ asị, hapụ akpịrị ya."

Ebe foto si, Twitter/Ruth Richardson
Ulọọrụ nchekwa Federal Bureau of Investigation (FBI) kwuburu n'ụbọchị Mọnde na ha ga-enyocha ihe mere.
Onyeisi ndị uweojii Minnesota bụ Medaria Arradondo sị na ndị otu ha mmadụ anọ ahụ "abụghịzị ndị ọrụ anyị."
Ha kwuru na otu nwoke na-eche nche na ụlọnrị nwụrụ ka ya na "ndị uweojii na-enwe mmekọrịta."
Mayor nke Mpaghara Minnesota bụ John Frey kwuru na ọchụchụ ndị uweojii anọ ahụ bụ ihe kwesịrị ekwesi.
Ọ sịrị na ihe mere bụ ihe jọgburu onwe ya.
"Ekwenyere m n'ihe m hụrụ. Ihe m hụrụ jọgburu onwe ya etu ọbụla isi tụlee ya. Na mmadụ bụ onyeisi ojii n'Amerịka ekwesighi ịbụ amamikpe ọnwụ."
Nke a abụghị mbụ ndị uweojii mba Amerịka na-emekpa onye isi ojii ahụ.
N'afọ gara aga, BBC Igbo wepụtara akụkọ nwa afọ Igbo nwụrụ n'aka ndị uweojii n'ụzọ na-agba anya mmiri.
Chinedu Ikeobi na-agara onwe ya oge ndị uweojii chọro ijide ya, ya ajụ, ha were igwe latrik dọgbuo ya.
N'afọ 2014, ndị uweojii gburu onye isi ojii a kpọrọ Eric Garner ka ha na-achọ ịnwụchi ya na New York.
Anyammiri na obi mgbawa ka ndị mmadụ n'ụwa gbagburugburu ji ekwu maka ọnwụ George Floyd n'aka ndị uweojii.
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na soshal midia:
@aireyys si na ị mabeghị ka ọ na-adị ma ndị uweojii kwụsị gị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
@Vidi_LaVida sị na anyammiri ka na-agba ya maka ihe onyonyo George Floyd ya kiriri.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
@db23bd si na- nke a bụ ọchụ, ọchị metụtara ịkpa oke agbụrụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Kemgbe ya bụ ihe mere, ngagharịiwe bidoro na mpaghara dị icheiche maka ọnwụ George Floyd.













