Majek Fashek: Etu o si nwụọ na ihe ndị ị na-amaghị maka ya

Aha onyonyo, Majek Fashek: Etu o si nwụọ na ihe ndị ị na-amaghị maka ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye otiegwu ama ama bụ Majekodunmi Fasheke ana etu 'Ọdọmiri' bụ 'Rain-maker' na Beke alakwụrụla ndị nna ya ochie.

Aha egwuregwu ejiri mara ya bụ Majek Fashek.

Nke a sị na olu onye nhazị ọrụ ya bụ Omenka Uzoma n'ụtụtụ a.

Uzoma kwuru na hohaa na ọbụghị coronavirus gburu Fashek makana oteela o ji arịa ahụ. O kwuru na ọ nwụrụ n'Amerịka n'ehihie nke ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun.

Majek Fashek

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ndị ịkwesiri ịma maka ya

Majekodunmi Fasheke eji Majek Fashek mara bụ oti egwu na ode egwu dara ụda n'oge 80's na 90's rukwa ugbua.

Egwu mbụ buputere ya bụ ọbọ egwu akpọrọ 'Prisoner of Conscience' nke gụnyere egwu wetere Fashek ọtụtụ nturuugo akpọrọ "Send Down the Rain"

Egwu ahụ mere ka akpọwa ya ọdọ mmiri.

Amụrụ ya n'Edo steeti n'afọ 1963 n'ụbọchị asaa nke ọnwa Maachị.

Majek chọbụrụ itipụta egwu ụka tupu ọ nwụọ dịka onye nhazi ya bụ Uzoma si gwa BBC.

Etu egwu ya si metụta Afịrịka

Ọ na-agụkarị egwu na-eweta udo na njikọ aka.

Onye nhazi Fashek kwuru ka ndị mmadụ ga gere ọbọ egwu "Weep not Children" makana Fashek ji egwu ahụ wee kwuputa ka ihe ndị gbagọrọ agbagọ n'Afịrịka na etu a ga-esi dozi ya.

Uzoma kwuru na ọ chọrọ ka gọọmenti Naịjirịa kwanyere Fashek ugwu site n'ime ka ụbọchị ncheta ọmụmụ ya bụrụ ụbọchị ịṅụ ọnụ maka Majek Fashek.

N'okwu ya, " ọ ga-adị mma ka ndị Naịjirịa na ụwa niile were ihe ọma, mkpalite mmụọ ndị Afịrịka, ihe o mepụtara were na-echeta Fashek."

Ọ Lụrụ nwaanyị, kedụkwanụ maka ezinụlọ ya?

Aha nwunye ya bụ Rita Fashek onye ọ gụrụ egwu akpọrọ "Without you."

Ha mụrụ ụmụ anọ mana ha mechara gawara onwe ha n'afọ 2015.

Ọtụtụ mmadụ amalitelarị ide ihe na Twitter gbasara ọnwụ ya.

Ihe ndị o mere n'ogo mbaụwa

Ya na ndị otiegwu ama ama dịka Tracy Chapman, Jimmy Cliff, Michael Jackson, Snoop Dogg, and Beyoncé arụkọla ọrụ.

N'afọ 2016, Fashek na so ndị ama ama ruru narị abụọ gụọ egwu a bara "We Are Not Afraid" iji wekọta ego nye International Rescue Committee (IRC) na Human Rights Watch (HRW).

Udiri egwu o na-eti

Ndị Fashek yiri n'egwu gụnyere Bob Marley, Jimi Hendrix, Fela Kuti. O ji egwu Carribean nke akpọrọ Reggae wee malite wee mepụtazia nke ya ọ kpọrọ Kpangolo.

Lee ihe ha dere:

Dr Sid bụ otiegwu ama ama na Naịjirịa kwuru na o chetara mgbe nne na nna ya ji egwu Fashek akpọrọ Prisoner of Concience na I & I Experience vinyls n'afọ 1989, mgbe ahụ bụ oge mbụ ọ na-anụ maka

Fashek.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Tolu Ogunlesi bụ onye enyemaka onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari maka mgbasaozi ọhụrụ dere na:

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

N'ozi arịrị nke ya Festus Keyamo bụ Minista steeti nke Niger Delta Affairs sị na:

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ụfọdụ egwu o tiri

Akụkọ ga-amasị gị