Ras Kimono: Onye ga-echefu 'Under pressure' ?

Ras Kimono

Ebe foto si, Tony Okoroji/Facebook

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara taa maka ikele Ras Kimono 'naa n'ndokwa'
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Emume akwamozu Augustine Oseloke Onwubuya bụ onye ama ama dịka Ras Kimono bụ otiegwu reggae nke ama ama ebidola taa.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-akwado ya nakwa ndị egwu regge na-atọ nke ọma pụtara n'ụlọọrụ 'Copyright Society of Nigeria n'Ikeja' na Legọs, n'ụtụtụ Tọọsde, ikele ya nakwa sị ya ịjeọma.

BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ gbasara ihe a ga-eji cheta onye a bụ Ras Kimono.

Pretty Okafor bụ onyeisi otu ndị oti egwu akpọrọ "Performing Musicians Association of Nigeria" na Bekee gwara onye ntaakụkọ anyị na ọnwụ Ras Kimono ka na-agbawa ndị oti egwu niile bị na Naijiria na mba ofesi obi.

Aha nkeananụānụ, Ọnwụ Ras Kimono na-eme m ka nrọ

Onye ọzọ bụ Ugochukwu Stephens ama ama dịka Rugged Man gwara BBC Igbo na egwu dị iche iche Ras Kimono tiri n'ụwa ga-adị ebiebi.

Aha nkeananụānụ, Anaghị m echezọ 'Under Pressure'

Na soshal midia, ozi di iche iche na-ekele Ras Kimono ka nkụ.

Mmadụ dịka @zachariahkelvi1 dere na twitter Ijeoma Ras Kimono.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

‏Onye ọzọ bụ @kulgp4frank dere na ya na-enye ya ekele nke ịkpeazụ

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Dịka ezinaụlọ ya siri kwupute n'akwụkwọ ozi ha, ha kọwara na ha ga-eli Kimono na be nna ya n'Onicha Olona dị na Delta steeti n'ụbọchị 25 n'ime ọnwa nke a.

Ndi na-akwado Ras Kimono

Ebe foto si, Tony Okoroji/ facebook

Nkọwa foto, Ha ga-eji ụbọchị atọ kwanyere ya ugwu ikpeazụ

Onye bụ Ras Kimono

Ha mụrụ ras Kimono Ras n'Ekeleke Elumelu n'Onicha Olone na Delta steeti n'ụbọchị itoolu n'ịme ọnwa Mee n'afọ 1958.

Ọ gara Gbenocha Sekondari n' Agbor na Delta Steeti.

Ya na Majek Fashek banyere otu regge nke akpọrọ Jastix Reggae Ital

Egwu ya 'Under Pressure' bụ nke mbụ ya pụtara n'afọ 1989.

Ọ turu ugo dị iche iche maka egwu ya na Naịjirịa nakwa mba ofesi.

Ọ nwụrụ n'ụbọchị iri n'ime ọnwa Juun n'afọ 60.