Dike Igbo ndị so afọ 2018 laa

Achuzia,Ikedife,Ras Kimono,Ikeogu

Ọtụtụ ihe nrịba ama mere n'afọ 2018 mana o nweghi nke gbawara obi karịa ọnwụ ụfọdụ ndị Igbo ji eje mba dịka ndị a:

1. Joe Achuzie

Joe Achuzia
Nkọwa foto, Joe Achuzia sọ na ndị ndu ndị agha Biafra nke a lụrụ bido n'afọ 1967 rue afọ 1970

Dike Biafra a nwụrụ n'abalị 26 nke ọnwa Febụwarị, afọ 2018 ka ọ gbachara afọ 89.

Achụzia bụbu onye agha Naịjirịa tupu a gbaa ọsọ agha, o were sonye agha Biafra n'afọ 1967.

E buliri ya n'ọkwa 'Major' ma nye ya ọkwa onye ndu 11 Battalion' nke ndịagha Biafra ndị kpara ike n'oge agha.

2. Dozie Ikedife

Dozie Ikedie

Dozie Ikedife bụbu onyeisioche ndị Ohaneze Ndigbo n'ọkwa 'President General'.

Ọ nwụrụ n'abalị 11 nke ọnwa Disemba, afọ 2018 ka ọ gbachara afọ 88.

Ọ bụ nnukwu dọkịnta na-ahụ maka ahụike ụmụnwaanyị ma bụrụkwa onye hibere ụlọọgwụ 'Ikedife Specialist Hospital, Nnewi." Ọ bụkwa onye a ma dịka ọnụ na-ekwuru Igbo n'ihe gbasara ọchịchị Naijiria.

Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo gbara akaebe ka Ikedife nwụrụ sị na ọ bụ onye na-"ekwupụta ihe na-ewute Ndigbo na-atụghị egwu ihe ndị mmadụ ga-ekwu."

3. Ras Kimono

Ras kimono

Ebe foto si, Ras Kimono facebook

Nkọwa foto, A mara Ras dịka onye na-eti egwu Rege na-ekwu okwu banyere Naịjirịa na etu ihe si aga na ya

Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na nwoke ike ahụ e jiri egwu ya bụ, 'Under Pressure' na 'Rum-Bar style' were mara bụ nwa afọ Igbo ezi aha ya bụ Oseloke Augustine Onwubuya.

Ras Kimono, onye Elumelu dị na Delta steeti, dara n'ọdọụgbọelu dị na Legọs ka ọ na-eche ụgbọelu ifepụ gaa Amerịka, e bugaa ya ụlọọgwụ ebe ọ nọ nwụọ n'abali 10 nke ọnwa Juun.

4. Efe Okedi

Efe Okedi

Ebe foto si, Ras Kimono/Instagram

Nkọwa foto, Efe Okedi, nwunye Ras Kimono

Nwunye Ras Kimono bụ Efe Okedi sochikwara ya ọnwa atọ di ya nwụchara n'abali 23 ọnwa Sepụtemba, afọ 2018.

Efe bụ nwunye nke atọ Raskimono ma bụrụkwa onye nchịkọta ya nke a kpọrọ 'Manager' na Bekee.

Akụkọ kwuru na o kwuru na ahụ adịchaghị ya, e buru ya gbaga ụlọọgwu mana ọ nwuru na-egbughị oge.

5. Chike Osuji

Chike Osuji

Ebe foto si, Chike Osuji on Facebook

Chike Osuji bụ aka ochie n'ihe nkiri 'Nollywood' nwụrụ ka ọ gbachara afọ iri isii na ise n'ọnwa Juun afọ 2018.

Akwụkwọ akụkọ kwuru na ọ nwụrụ site n'ọrịa akụrụ(kidney disease).

Ejije e jiri mara Osuji onye hapụrụ nwunye ya na ụmụ anọ were laa mụọ gụnyere 'The Governọr', "40 Days in the Wilderness'.

6. Ikeogu Oke

Ikeogu Oke

Ikeogu Oke, onye a ma ama dịka onye na-ede mbem na akụkọ dị iche iche nwụrụ n'ụbọchị 24 Nọvemba n'Abụja ebe ọ na-anata ọgwụ maka ọrịa kansa anyịnya (Pancreatic cancer).

N'afọ 2017, Ikeogu ritere ego puku dọla 100 dịka onye ọkachasị n'ide agụmagụ na Naịjirịa nke a kpọrọ "Nigerian Prize of Literature" maka akwụkwọ ya ọ kpọrọ, “The Heresiad”.

7. Debe Ojukwu

Ojukwu

Ebe foto si, Voice of the East

Nkọwa foto, Debe Sylverster Ojukwu bụ nwa mbụ Dim Ọdumegwu Ojukwu

Debe Sylvester Ojukwu bụ ọkpara dike Biafra bụ Emeka Odumegwu Ojukwu nwụrụ n'abalị abụọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2018 site n'ọrịa shuga.

Nwa afọ a, onye bụ onye uweojii ma bụrụkwa ọkaiwu gbara ihe ruru afọ iri isii tupu ọ nwụọ.

Akụkọ ga-amasị gị: