Ahụghị ụzọ enweghị ihe o gbochiri - Di na nwunye kpuru isi
Ọtụtụ ndị nwere ọrụsị na Naịjirịa nọ n'okporo ụzọ dị icheiche na-arịọ arịrịọ.
Mana di na nwunye a bụ Okwudili na Loveth Egbo ekweghị ka ọrụsị ha kwụsị ha ibi ndụ ha etu o kwesiri.
Agbanyeghi na ha abuọ kpuru isi, ha kwekọrịtara lụọ onwe ha ma biri n'ụdọ ma mụtakwa ụmụaka.
Ha nwekwara ọrụaka ha na-arụ nke ha ji enyere ndụ aka karịa ịga nọrọ n'ụzọ na-arịọ arịrịọ.
Na mkparịtaụka ha na BBC Igbo nwere, di na nwunye a kọwara etu ha siri kpaba nkata a ghọrọ ngịga.
Kirie ya n'uju:
