Nwanyiocha: Omenala Igbo na-amasị m nke ukwu

Aha onyonyo, Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya

Nwanyiocha bụ onye mba Swizaland lụrụ onye Igbo abụrụla onye ama ama na soshal midia maka ịhụnanya o nwere n'asụsụ Igbo na omenaala Igbo nke o ji akara soshal midia ya akwado.

Ya na di ya bụ onyue Igbo ji ụmụ atọ dịka ha bi na mba Switerland ugbua mana ha na-abịa ala Igbo kwa mgbe kwa mgbe.

Ndị mmadụ kpụ aha Nwaanyị a n'ọnụ ugbua na soshal midia dịka ọtụtụ na-ekwu na onye ahọpụtara ka ọchị n'oche gọvanọ Anambra Steeti na afọ anọ na-abịa abịa bụ Charles Soludo họpụta ya dịka Kọmịshọna na-ahụ maka omenala na ndị njem nleta anya na steeti ahụ.

Ihe mere ndị mmadụ ji akpọ oku ka ahọpụta Nwaanyịọcha dịka kọmịshọna omenaala

Ọtụtụ ndị mgbe ka nwaanyịọcha na-ewepụta foto nakwa onyonyo ebe ọ na-eme ihe niile gbasara omenaal Igbo.

Ọtụtụ mgbe ka ọ na-egosi ebe o na-esiri ụmụ ya ndị ọcha nri Igbo, kpọrọ ha si mba Switzerland ka ha bia ala Naịjirịa bia kirie Mmọnwụ, maọbụrụ kuziere ha egwu Igbo.

O na-etinye ihe ndị a niile na soshal media ya ebe ọtụtụ mmadụ na-ekiri ya.

Na December 2021. ka o tinyere onyonyo ebe a na-agwọrọ ya ede na bee di ya n'Isuofia, Anambra steeti ka ha lọtachara maka emume ekeresimesi.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere Nwaanyị Ọcha na soshal midia ugbua

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere Nwaanyị Ọcha na soshal midia ugbua

Lee ihe ndị ọzọ ndị mmadụ na-ekwu banyere nke a:

Ihere mere ndị mmadụ ji kpụrụ aha Nwaanyị Ọcha n'ọnụ ugbua

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Ihere mere ndị mmadụ ji kpụrụ aha Nwaanyị Ọcha n'ọnụ ugbua
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nhọpụta Nwanyiocha dịka Kọmịshọna n'Anambra steeti

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nhọpụta Nwanyiocha dịka Kọmịshọna n'Anambra steeti

Dịka ọtụtụ ndị mmadụ nọ na ndọrọndọrọ n'okwu ugbua, kịrịe ihe onyonyo a ka ịhụ ihe Nwanyiocha gwara BBC Igbo n'oge gara aga banyere mmasi o nwere n'ebe omenala Igbo dị na-etụ o si agba mbọ ịhụ na omenala Igbo kwụ chịm na mba ụwa niile.

Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho