'E kwenyere m na ọdighi ihe di iche n'etiti nwaanyị na nwoke' - Chimamanda

Ebe foto si, BBC Igbo
Onye odee akwkụkwọ a ma ama a na-akpọ, Chimamanda Ngozi Adichie ,bịara njem nleta ndị BBC Igbo n'ụlọ ọrụ ha dị na Legọs n' ụbọchị Wenezde.
Mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ ihe bụ uche ya gbasara nhata nha nọ n'etiti nwoke na nwanyị, Ọ sị n'ime onwe ya na o kwenyere na ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị bụ otu n'anya ya.
Nke a mere na oke niile ruru umu nwoke aka kwesiri irukwa ụmụnwanyị aka karịcha ugbu a ihe niile na-agbanwe agbanwe.

Ebe foto si, BBC Igbo





