'E kwenyere m na ọdighi ihe di iche n'etiti nwaanyị na nwoke' - Chimamanda

Chimamanda Adichie

Ebe foto si, BBC Igbo

Nkọwa foto, Chimamanda asọghị okwu mgbe ndị BBC Igbo gbara ya ajụjụ maka nhata nha dị n'etiti umunwoke na umunwaanyị

Onye odee akwkụkwọ a ma ama a na-akpọ, Chimamanda Ngozi Adichie ,bịara njem nleta ndị BBC Igbo n'ụlọ ọrụ ha dị na Legọs n' ụbọchị Wenezde.

Mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ ihe bụ uche ya gbasara nhata nha nọ n'etiti nwoke na nwanyị, Ọ sị n'ime onwe ya na o kwenyere na ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị bụ otu n'anya ya.

Nke a mere na oke niile ruru umu nwoke aka kwesiri irukwa ụmụnwanyị aka karịcha ugbu a ihe niile na-agbanwe agbanwe.

BBC Igbo team

Ebe foto si, BBC Igbo

Nkọwa foto, BBC Igbo nabatara Chimamanda ọfụma