Ọ dị mma di na nwunye inwe otu ọbaego n'ụlọakụ?
Dịka di na nwunye na-emekọrịta ihe niile ọnụ dịka ịsa ahụ, i ri nri, i dinakọta n'otu akwa, ha o nwereike ikwe nwere otu ọbaego n'ụlọakụ?
Ajụjụ a ka BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị di na nwunye.
Ụfọdụ kọwaara na ha anaghị eme chacha, ebe ndị ọzọ kwuru na ha mere tupu ha na-agba akwụkwụ alụm di na nwunye.
Otu nwoke kwuru na nwunye ya nwereike i buru ego ha gbaa ọsọ, na ọ bụ ya mere ọ gaghị ekwe ka ha nwee otu ọbaego n'ụlọakụ.


