Kofi Annan: Ihe asaa ị maghị maka Dike Afrịka

Kofi Annan

Ebe foto si, Getty Images

Kofi Annan, onye chịburu otu mbaụwa a kpọrọ 'United Nations' (UN), ma bụrụkwa okpeudo a ma ama na mbaụwa, nwụrụ taa bụ Satọde, Ọgọst 18.

Ndị ndu mba dị iche iche n'ụwa gbaa gburugburu na-ekwupụta obi mwute ha maka ọnwụ ya, ma na-ebunye ezinaụlọ ya ụkpa ekele maka ezi ọrụ niile ọ rụrụ n'ụwa tupu ọ laa mụọ.

Lee ihe ndị ị maghị maka dịke Afrịka ji eje mba:

1. Ọ bụ onye isi ojii Afrịka mbụ chịrị dịka ọnyeisi UN.

Ọchịchị ya sochiri nke Boutros Boutros-Ghali, onye Afrịka chịrị UN naanị agba mbụ, ma chịa agba abụọ bụ afọ ise, afọ ise.

Kofi Annan

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kofi Annan, bụ onye isi ojii Afrịka mbụ chịrị 'United Nations'

2. Ọ bụ ejima. Ejima nwanne ya nwanyị bụ Efua nwụrụ n'afọ 1991.

3. O ritere nturuugo 'Nobel' nke ya na otu UN so nweta n'afọ 2001 maka nhazi o mere n'otu ahụ dịka otu na-akpa udo.

4. Nwaanyị mbụ ọ lụrụ bụ onye Naijiria, nwaada Yoruba a kpọrọ, Titi Alakija.

Ha mụtara ụmụ abụọ; nwaanyi, Ama na nwoke, Kojo. Mana ha gbasara n'afọ 1983 ka afọ iri na asatọ gachara. Ọ lụrụ onyeọcha, Nane, onye mba Swiden.

Kofi Annan na nwunye ya bụ Nane

Ebe foto si, Getty Images

5. O nwere otu ọkwọ ụgbọala bụkwa onye ya na ya bụ 'ahụghị na erighị' rue Ọgọstụ 18, 2018, ụbọchị ọ nwụrụ.

6. Kofi Annan bụ onyeisi otu 'Elders' otu na-agba mbọ maka udo na ikike dịrị onye nke Nelson Mandela hibere.

Kofi Annan

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kofi Annan bụ onyeisi otu 'Elders' nke Mandela hibere

7. Agbanyeghị na Kofi Annan bụ dike e ji aha ya a ga mba, o nwere ebe o si rie mperi mgbe ọ dị ndụ.

A na-arụ ya aka maka ọtụtụ ndị mmadụ tufuru ndụ ha n'Agha Rwanda.

E kwuru na o gburu oge inye iwu ka ndị agha udo nweta ngwaọgụ n'agha ahụ riri mmadụ ruru 800,000.

Ọkpụkpụ ndị e gburu n'Agha Rwanda

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kofi Annan kwuru na ọ tara ọnwe ya ụta ịkpụ ụkwụ n'ala n'okwu gbasara Agha Rwanda

Ihe ọzọ ndị mmadụ tara ya ụta bụ nzọ ụkwụ ya n'ebubo e boro otu onye welitara isi n'ụlọọrụ UN a kpọrọ Ruud Lubbers.

E boro Ludder ebubo mmekpaahụ ụmụnwaanyị ya na ha na-arụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: